flag of Nigeria The Book of Common Prayer
United States England Scotland Ireland Wales Canada World

 
    Ekpere Na Abu
The Book of Common Prayer in Igbo

 

EKPERE

ANĒKPERE CHINEKE N'ỌBỌ

N'OKWU IBO.

 

 

 

PUBLISHED BY C.S.S. BOOKSHOPS
 


 

 

IHE NILE DI N'AKWUKWỌ NKA.

 

  PAGE
1. Ihe-nmuta na Abù Ọma arọputara ka agua ha
n'ubọchi Sunday na Ubọchi Nsọ ọzọ
vi
2. Calendar na Ihe-nmuta agāgu x
3. Usoro nke Ekpere Ututu 1
4. Usoro nke Ekpere Anyasi 15
5. Litany 25
6. Kọlekt na Akwukwọ Ozi na Ozi Ọma aganāgu
mgbe anēnye Oriri Nsọ, n'ogologo Arọ nile
32
7. Usoro nke Inye Oriri Nsọ 199
8. Usoro nke Baptism nke emere n'iru ọda madu 224
9. Usoro nke Baptism nke ndi nwere ike izara
onwe-ha
232
10. Catechism 240
11. Usoro nke Inye-ike 247
12. Uzọ Ijikọ di na nwunye 250
13. Usoro nke Ilì ozu 259
14. Ikele-ekele nke Ndinyom mgbe ha musiri nwa 263
15. Idọ-aka-ne-nti, ma-ọbu ikwuputa iwe Chineke
na ikpe-Ya nile megide Ndi-nmehie
265
16. Abu Ọma nke Devid 272
17. Usoro na uzọ ime Ndi Dikọn 446
18. Uzọ na Usoro esi echi Ndi Presbita 452

 

 

Table of Contents

Otú, Ahara àkà Igu Akwukwọ Abù Ọma.

Aganāgusi Akwukwọ Abù Ọma kwa-ọnwa, otú akara ya, ma n'Ekpere Ututu ma n'Ekpere Anyasi. Ma n'ọnwa February agāguru ya nání ri'ubòchi nke-orú-na-asatọ ma-ọbu nke-orú-na-iteghete n'ọnwa.

Ebe January, March, May, July, August, October, na December nwere n'otù n'otù orù ubọchi na iri na otù: Akara na agāgu otù Abù Ọma ahu n'ubọchi ikpe-azu n'ọnwa ndia nke aguru n'ubọchi nke-orù-na-iri: ka ewe malite ọzọ igu Akwukwọ Abù Ọma n'ubọchi mbu nke ọnwa ọzọ so ya.

Ọzọ, ebe ekere Abù Ọma 119 orú òkè na abua, ebe o to-kwa-ra ogologo nke-uku igu ya otù mbe; edoziri ya ka ewe ghara igu kari anọ ma-ọbu ise nime orú òkè na abua ahu n'otù mbe.

N'ikpe-azu Abu Ọma ọ bula, ma-ọbu n'ikpe-azu òkè ọ bula n' Abù Ọma 119, ka agāgu Abù nka,

Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;

Otú ọ diri na mbu, ọ di ubu a, gādigide otú a: we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 


 

The Order How the Psalter is Appointed to be Read

USORO NKE

EKPERE UTUTU,

KWA-UBỌCHI N'ARỌ

Na nmalite Ekpere Ututu Minister gēwere olu ike gua otù ma-ọbu kari otù nime Ama-okwu ndia si n'Akwukwọ Nsọ puta nke so. Agusia, ọ gāgu ihe edeworo n'akwukwọ n'okpuru Ama-okwu ndia.

Mbe onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke ọ meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.     Ezikiel 18. 27.

N'ihi na mu onwem mara njehiem nile, nmehiem di kwa n'irum mbe nile.     Abù Ọma 51. 3.

Zopu iru-Gi na nmehiem nile, hichapu kwa ajọ omumem nile.     Abù Ọma 51. 9.

Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I digh-eleda ya anya.     Abù Ọma 51. 17.

Dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi-ebere ka Ọ bu, Onye nādigh-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.     Joel 2.13.

Onye-nwe-ayi Chineke-ayi ka obi-ebere nile na nbaghara nile diri; n'ihi na ayi anupuwo isi n'okpuru Ya; ayi egegh kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, nti, ijeghari n'iwu-Ya nile, nke O tiyere n'iru ayi.     Daniel 9. 9, 10.

Dọm aka na nti, Jehova, ma naní n'ikpe; adọlam aka na nti n'iwe-Gi, ka I we ghara ibilatam.     Jeremaia 10. 24.   Abù Ọma 6. 1.

Chegharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.     Matiu 3.2.

M'egēbili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe na n'iru gi: ekwesighm ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.     Luk 15. 18, 19.

Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpe; n'ihi na ọ digh onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.     Abù Ọma 143. 2.

Ọ buru na ayi asi na ayi enwegh nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adigh kwa nime ayi. Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka Ọ we baghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.     I Jọn 1. 8, 9.

Umu-nnam m'huru n'anya nke-uku, Akwukwọ Nsọ nēzí ayi n'ebe di iche iche ka ayi kwere ọtutu nmehie-ayi na ajọ omume-ayi, ka ayi kwuputa ha; ka ayi ghara izobe ma-ọbu kpuchie ha n'iru Chineke, bú Nna-ayi nke elu-igwe, Nke puru ime ihe nile; kama ka ayi kwuputa ha n'obi di ume-ala, nke nwayọ, nke ncheghari, na nke inu-okwu, ka ayi we nata nbaghara nmehie-ayi site n'obi-ọma-Ya na ebere-Ya nādighhagwu agwu. Ọ bu ezie na ọ kwesiri ka ayi nēkwere nmehie-ayi n'iru Chineke n'obi di ume-ala mbe nile: ma ọ kwesiri ka ayi nēme kari otú ahu mbe ayi nọkọrọ zukọ kwa n'otù ka ayi kele Ya ekele n'ihi oke ihe ọma nile nke ayi natara n'aka-Ya; ka ayi gosi otuto nke kwesiri Ya n'ezie n'iru ọra madu; ka ayi nuru Okwu-Ya nke kasi di nsọ; ka ayi riọ ihe nile nke kwesiri ayi, nākpa ayi, rna n'aru rna na nkpuru-obi nke ayi. Ọ bu n'ihi nka ka m'nēkpere unu, nārio unu, ka unu ra nọ n'ebe a, ka unu sorom n'obi ọcha na olu di ume-ala, we je n'oche-eze amara nke elu-igwe, nāzasom:
 

Morning Prayer

Nkwuputa-nmehie nkẹ ọra madu, nke ndi nile nọ na nzukọ ahu ganazaso Minister, ya na ha ebue ikpere n'ala.

Nna-ayi nke puru ime ihe nile, Onye kasi ebere; Ayi ejehiewo, kpafu kwa n'uzọ-Gi ka aturu furu efu, Ayi sokariri izuzu na ọchichọ nke obi-ayi. Ayi emebiwo iwu-Gi di nsọ. Ayi arapuwo ime ihe kwesiri ka ayi me; Ayi emewo kwa ihe nēkwesigh ka ayi me; Ezi ndu adigh nime ayi. Ma Gi, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, ayi ndi ọjọ nke di imere ebere. Chineke, rapu ndi kwuputara ihe ọjọ ha mere. Weghachi ndi nēcheghari uche-ha; Dika nkwa-Gi nke | kwere madu nile nime Kraist Jisus, bú Onye-nwe-ayi. Kwe, Nna nke kasi ebere, n'ihi Ya; Ka ayi we si ubu a diba ndu iyi Chineke, na nke ezi omume, na ndu anya-udo, Ka otuto we diri Aha nsọ Gi. Amen.

Ntọpu, ma-ọbu Nbaghara nmehie, nke náni Presbyter gāgu, ka o neguzo ọtọ; ọra madu ebue ikpere n'ala.

Chineke, Nke puru ime ihe nile, Nna nke Ony-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye nāchọgh ọnwu nke onye-nmehie, kama ka o si n'ajọ omume-ya puta, ka ọ we di ndu; Onye were ike na iwu nye Ndi-ozi-Ya, ka ha we kwuwa gu-kwa-ra ndi-Ya Ntọpu na Nbaghara nke nmehie-ha, ebe ha cheghariri: Ọ gābaghara tọpu kwa ndi nile cheghariri n'ezie, ndi nējigh aghughọ kwere Ozi Ọma Ya di nsọ. N'ihi nka ka ayi riọ Ya ka Ọ nye ayi ezi ncheghari na Mọ Nsọ Ya, ka ihe nile ayi nēme ubu a we tọ Ya utọ; ka ndu-ayi fọduru we si ubu a nādi ọcha na nsọ; n'ikpe-azu ka ayi we bia n'ọńm ebigh-ebi nke Ya; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Ọra madu gāza n'ebe a na ngubi ekpere ọzọ nile, Amen.

Emesia, Minister gēbu ikpere n'ala, ọ gēwere olu agānu nke-ọma gua Ekpere nke Onye-nwe-ayi; ọra madu nile gēbu kwa ikpere n'ala nāzaso ya, ma n'ebe a, ma n'ebe ọ bula ọzọ eji ya kpere Chineke.
 

Confession
Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka Aha-Gi di nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. Baghara ayi ihe ọjọ nile ayi mere, Otú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ. Edubala ayi nime ọnwunwa; Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe: N'ihi na ala-eze bu nke Gi, Na ike, na otuto, Mbe nile mbe nile. Amen.

Agusia, ọ gāsi,

    Onye-nwe-ayi, meghe ebubere-ọnu-ayi.
    Ọziza. Ọnu-ayi gēkwuputa kwa otuto-Gi.
    Presbyter. Chineke, zọputa ayi ọsọsọ.
    Ọziza. Onye-nwe-ayi, me ngwa iyere ayi aka.

Ubu a madu nile gēbili ọtọ, Presbyter gāsi,

    Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;
    Ọziza. Otú ọ diri na mbu, ọ di ul;m a, ọ gādigide otú a: we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
    Presbyter. Tobenu Onye-nwe-ayi.
    Ọziza. Ka eto Aha Onye-nwe-ayi.

Emesia, agagu ma-ọbu bua Abù Ọma nke so: ma ọ buru na ọ digh n'ubọchi Easter, nke akara Abù ọzọ bayere ya; ọzọ kwa, n'ubọchi nke-iri-na-iteghete nke Ọnwa ọ bula agagh-agu ya n'ebe a, ma agāgu ya n'usoro nke Abù Ọma.

VENITE. Abù Ọma 95.

    Bianu, ka ayi tikue Jehóva | nkpu | ọńu: ka ayi tikusie oke nkume nke nzọpu|ta-ayi nkpu | ọńu | ike.
    Ka ayi were ekele bi'á | n'iru | Ya: ka ayi were abù ọma tikúsie | Ya nkpu | ọńu | ike.
    N'ihi na Chineke uku ká Je|hóva | bu: Ọ bu kwa Eze úku | nāchi | chi nile.
    Onye ebe nile nke michasiri emi nké uwa di | n'aka|-Ya: ebe dichasi elu nké ugwu | nile | bu kwa | nke Ya.
    Onye nwere oke osimiri, Yá onwe-ya | me-kwa-ra | ya: ọ bu kwa aka-Ya kpúru | ala | akọ|rọ.
    Batanu, ka ayi kpọ isi ala rúru | kwa | ala: ka ayi bue ikpere n'ala n'iru Jehóva | Onye | meworo | ayi.
    N'ihi na Ya onwe-ya bú Chi|neke|-avi : ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzu dika aturu, buru kwa igwe átu|ru nke | aka|-Ya.
    Ta, ọ buru na unu ege nti olu-Ya, unu emela ká obi-unu | sie i|ke: dika na Meriba, dika n'ubọchi | Masa | n'ọza|ra,
    Mbe nná-unu|-ha nwa|ram : nwaputam í|he, hu | kwa | ọlum.
    Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọbọ ahu ó|yi, M'we | si: Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu, ha onwe-ha amagh | kwa | uzọm | nile,
    N'ihi ya ańurum fyi | n'iwem, lsi: Ha agagh-abá | n'izu|-ikem | ma-ọli.
    Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
    Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigi|de o|tu a: we rue n'úwa | ebigh-e|bi, A|men.

Emesia, Abù Ọma gēso n'usoro dilea esi ka ha. N'ọgwugwu nke Abù Ọma ọ bula n'ogologo arọ nile, na n'ọgwugwu nke Benedicite na Benedictus na Magnificat na Nunc dimittis ka agāgu,

    Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;
    Otú ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigide otú a: we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Lord's Prayer

Emesia, ageēwere olu agānu nke-ọma guwa Ihe-nmuta Mbu, nke eweputara nime Testament Ochie, dika esi ka nime Calendar, ma ọ buru na Ihe-nmuta nke arọputara arọputa adigh nke akara ka agua ha n'ubọchi ahu: Onye nāgu ya gēguzo che kwa iru otú ndi nile nọ ebe ahu gēsi nu olu-ya nke-ọma, Ma agusia, agāgu ma-ọbu bua Abù anākpọ Te Deum Laudamus kwa-ubọchi n'ogologo arọ nile.

Riba ama, Na tutu agua lhe-nmuta ọ bula Minister gāsi, Ubu a agāgu Isi di otú a, ma-ọbu Ama-okwu di otú a nke Isi di otú a, nke Akwukwọ di otú a: Agusia Ihe-nmuta ọ bula, ọ giisi kwa, N'ebe a ka agagubi Ihe-nmuta Mbu, ma-obu. Nke-abua,

TE DEUM LAUDAMUS.

    Chineke, ayí | nēto | Gi: a yi kwere na Gí | bu O|nye-nwe-jayi.
    Elu-uwa dúm nā|sọpuru | Gi: Nná | nke mbe | ebigh-e|bi.
    Gi ka ndi-mọ-ozi níle | nākpọ|ku: Elu-igwe na Íke | nile | di ha | nime.
    Gi ka Cherubim ná | Sera|fim : na | kpọ —|ku mbe | dum.
    Nsọ, | Nsọ, | Nsọ: Jehova Chineke nké usu | nile | nke ndi|-agha.
    Elu-igwe na úwa | juputa|ra: n'Ébube | nke o|tuto|-Gi.
    Usu Ndi-ozi-Gi nke dí | otu|to: né | — — |to — | Gi.
    Nmekọ ọma ahu, bú ndi|-amuma|-Gi: né|— —|to — | Gi.
    Usu ndi-agha, bu ndi-ama-I ndi yíri | uwe ọ | cha: né|— —|to — | Gi.
    Nzukọ nsọ Kraist nke di n'elu | uwa | nile: kwé| — —|re— | Gi.
    Chí|neke | Nna: Ó|nye di | ebu|be.
    Ọkpara-Gi, Nke | múru | nani | Ya: Nke di nsọpuru | na e|zi-o|kwu.
    Mọ |— Nsọ | kwa: Ọ|nye-nka|si-o|bi.
    Gi bu Éze nke | otu|to : Gí | — — | — — | Kraist.
    Gi bu Ọkpara | ebigh-e|bi: nké | — — | — — | Nna.
    Mbe I mere Onwe-i madu ka I we zọ|puta | madu: I leligh áfọ | Nwa — | a —|bọghọ.
    Mbe I merisiri ihe-ọbuba | nke ọ|nwu: I meghere Ala-eze nke Elu-igwe nyé | ndi-o|kwukwe | dum.
    Gi nọduru n'aka-nrí | Chine|ke: n'ọ|tuto | nke — | Nna.
    Ayi kwere ná | I gā|bia: ka I búru | Onye |-ikpe|-ayi.
    Ya mere ayi nēkpere Gi, yere ndi-órù-|Gi a|ka: ndi I ji ọbara-Gi di óke | ọnu | bapu|ta,
    Me ka agukọta ha ná Ndi | Nsọ nke | Gi: n'ó|tuto| ebigh-e|bi.
    Onye-nwe-ayi, zọpu|ta ndi | nke I: gọzi | kwa i|he-nke|ta-I.
    Búru | eze- | ha: buli kwa há | elu | ebigh-e|bi.
    Kwa- | ubọch|i: ayí | nē —|buli | Gi;
    Ayi nāsọpuru Ahá-Gi | mbe ni|le: wē rue | n'uwa | ebigh-e|bi,
    Onye-nwe-ayi, wédata | Onwe-|Gi: ka I debe ayi ta ká ayi | ghara | ime|hie,
    Onye-nwe-ayi, mére ayi | ebe|re: mé|re ayi | ebe|re.
    Onye-nwe-ayi, ka ebere-Gí | dakwasi | ayi: ebe ntukwasi-ọbi|-ayi — | di na | Gi.
    Onye-nwe-ayi, ọ bu Gi ka m'tukwási|ri o|bi: ekwéla | ka i|here | mem.
 

 

Emesia, agāgu otú a kwa Ihe-nmuta Nke-abua, nke eweputara nime Testament Ọhu. Ma agusia, agāgu Abù nke so; ma agagh-abù ya n'ubọchi ọ bula agāgu ya n'Isi nke diri ubọchi ahu, ma-ọbu mbe agāgu ya n'Ozi Ọma diri Ubọchi nke Jọn Baptist.

BENEDICTUS. Luk. I. 68-79.

    Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bu Onye-nwe-ayi, Chiné|ke nke | Israel: n'ihi na Ọ letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra há | ọlu | nbapu|ta,
    Ọ weliwo-kwa-ra ayi mpí nke | nzọpu|ta: n'ulo onye nējere Ya | ozi, | bu De|vid,
    Dika O kwuru site n'ọnu ndi-ámuma-|Ya di | nsọ: sí|te n'o |ge — | mbu,
    Nzọputa n'áka ndi-|iro-|ayi: na n'aka ndi níle | nākpọ | ayi a|si:
    Imere nna-ayí-ha | ebe|re: na icheta ọbu|ba- —|ndu nsọ | Ya;
    Iyi Ọ ńuru Ábra|ham nna-|ayi: í|kwe—| ye — | ayi,
    Ebe adọputaworo ayi n'áka ndi-|iro-|ayi: ka ayi nēkpére | Ya nā|tugh e|gwu,
    N'obi ọcha na ézi omume | n'iru | Ya: ú|bọ-chi|-ayi ni|le.
    Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi íhe | nile | elu: n'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idózi | uzọ-|Ya ni|le;
    Ime ndi nke Ya ka ha mára | nzọpu|ta: nime nbághara | nmehie | nile | ha,
    N'ihi obi ebere nké Chi|neke-|ayi: nke ọwuwa-anyanwu nke sitere ri'élu gē|leta ayi | nime | ya,
    Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na ónyinyo | ọnwu ì|he: iduzi ukwu-ayí | ba n'u|zọ u|do.
    Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
    Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādigi|de o|tu a: we rue n'úwa | ebigh-e|bi. A|men.

Ma-ọbu Abù Ọma nka,

JUBILATE DEO. Abù Ọma 100.

    Tikusienu Jehova nkpu ọńu ike, | uwa | nile: werenu ọṅu fè Jehova òfùfè, werenu iti-nkpu ọńu | bia | n'iru | Ya.
    Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bú | Chine|ke: Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi: ayi bu ndi-Ya, na igwe aturu nké | ọzù|zù-anu- | Ya.
    Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, werenu otuto ba n'ógi|ge-Ya | nile: kelenu Ya, gọzi- | kwa-nu|aha- | Ya.
    N'ihi na Jehova di nma; rue mbe ebigh-ebi ká e|bere-Ya | di: rue ọbọ nile ka ikwesi-ntukwási- | obi- | Ya di | kwa.
    Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ;
    Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādfgi|de o|tu a: we rue n'úwa | ebigh-e|bi, A|men.

Mbe Minister na ọra madu gāgu ma-ọbu bua Ọkwukwe nke Ndi-ozi, ha eguzo ọtọ; ma agagh-agu ya n'ubọchi ọ bula akara Okwukwe nke St. Athanasius ka agua ya.
 

 
    Ekwem na Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile, Onye kere elu-igwe na uwa.
    Ekwem na Jisus Kraist nání otù Okpara-Ya, bú Onye-nwe-ayi, Onye aturu ime site n'ike Mọ Nsọ; Nwa-abọghọ nāmagh nwoke, bú Meri, muru Ya, Ọ huru ahuhu n'ubọchi Pọntiọs Pailet, Akpọgidere Ya n'obe, Ọ nwua, elie Ya, Ọ ridara n'ala-mọ; N'ubọchi nke-atọ O si-kwa-ra na ndi nwuru anwu bilie ọzọ, Ọ rigoro n'elu-igwe, Ọ nānọdu n'aka-nri Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile: N'ebe ahu ka O gēsi bia ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu.
   Ekwem na Mọ Nsọ; Na Nzukọ Katolik nke di nsọ; Na nmekọ nke Ndi Nsọ; Na Nbaghara nmehie; Na Nbilite-n'ọnwu nke aru, Na ndu ebigh-ebi. Amen.

Nke ahu ga, agāgu Ekpere ndia nke so; mada nile gēwere nsọpuru bue ikpere n'ala; Minister gēburu uzọ were olu ike ei,

   Onye-nwe-ayi nọyere unu.
   Ọziza. Ka Ọ noyere kwa mọ nke gi.

   Minister. Ka ayi kpere Chineke.
   Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere.
      Kraist, mere ayi ebere.
   Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere.

Emesia, Minister na ndi Clerk na ọra madu gēwere olu ike gua Ekpere nke Onye-nwe-ayi.
 

Apostles' Creed
Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka Aha-Gi di nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. Baghara ayi ihe ọjọ nile ayi mere, Otú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ, Edubala ayi nime ọnwunwa: Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe. Amen.

Bmesio, Presbyter gēguzo ọtọ, si,

   Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi.
   Ọziza. Nye kwa ayi nzọputa-Gi,
   Presbyter. Jehova, zọputa Eze-nwayi-ayi.
   Ọziza. Were ebere nuru olu-ayi mbe ayi kpọkuru Gi.
   Presbyter. Were ezi omume yikwasi Ndi-ozi-Gi.
   Ọziza. Me kwa ka ndi I rọtara ńuria ọńu.
   Presbyter. Jehova, zọputa ndi nke Gi.
   Ọziza. Gọzi kwa ihe-nketa-Gi.
   Presbyter. Jehova, nye udo na mbe-ayi.
   Ọziza. N'ihi na ọ digh onye ọ bula ọzọ nāluru ayi ọgù, ma ọ bu nāní Gi, Chineke.
   Presbyter. Chineke, me ka obi-ayi di ọcha nime ayi.
   Ọziza. Ewepu-kwa-la Mọ Nsọ Gi nime ayi.

Emesia, Collect atọ gēso: nke-mbu bu nke diri ubọchi ahu, nke gābu otú ahu akara n'Oriri Nsọ; nke-abua bu n'ihi Udo: nke-atọ bu n'ihi Amara iji nēbi nke-ọma. Agagh-abanwe Collect ikpe-azu abua mbe ọ bula, ma agāgu ha kwa-ubọchi n'Ekpere Ututu n'ogologo arọ nile, dika o si so; madu nile gēbu ikpere n'ala.
 

Lord's Prayer
Collect nke-abua, n'ihi Udo.

Chineke, Onye wetara udo, Onye nuru idi-ri'otù n'anya, Onye Nke imara Gi bu inwe ndu ebigh-ebi, Onye ofùfè anēfè Gi bu ipuzu n'orù dum. Nāluru ayi ọgù, bú ndi-orù-Gi di ume-ala n'obi, na nmegide nile nke ndi-iro-ayi; ka ayi ghara itu egwu ike onye ọ bula nēmegide ayi, ebe ayi tukwasiri obi na Gi gāluru ayi ọgù; site ri'ike Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Second Collect, for Peace
Collect nke-atọ, n'ihi Amara.

Jehova, Nna-ayi nke elu-igwe, Chineke Nke purn ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye wetara ayi n'udo we rue ri'ututu ubọchi ta; were ike uku Gi luara ayi ọgù nime ya; kwe ka ayi ghara idabà na nmehie ọ bula ta, ka ayi ghara ibabà n'uzo ọ bula di ize-ndu; rna ka ewe dozie omume-ayi nile site na nchikọ-Gi, ime ihe ziri ezi n'anya-Gi mbe nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Nime ọuire na n'Ebe ha nābù abù, Abù geso n'ebe a.

Emesia, agāgu Ekpere ise ndia nke so, ma agagh-agu ha nile mbe agāgu Litany; mbe ahu nání abua nke-ikpe-azu ka agāgu, ka esi debe ha n'ebe ahu.
 

Third Collect, for Grace
Ekpere n'ihi Eze-nwayi.

Jehova, Nna-ayi nke elu-igwe, Onye di elu di kwa ike, Eze nke ndi bu eze, Onye-nwe ndi nwe madu, Onye nání Gi nāchi ndi-isi, Onye si n'oche-eze-Gi nēle ndi nile bi n'uwa anya: ayi ji obi-ayi nile ariọ Gi ka I were iru-ọma-Gi lekwasi Eze-nwayi-ayi nwere obi-ọma, bu Elizabeth; si otú a nyejue ya amara nke Mọ Nsọ Gi, ka ọ we legide iru n'ihe I chọrọ mbe dum, nāgā kwa n'uzo-Gi. Were onyinye elu-igwe nye ya ri-nne; kwe ka ọ di ogologo ndu ri'aru-ike na ọdi-nma; nye ya ike imerisi ndi-iro-ya nile; n'ikpe-azu, mbe ndu nka gasiri, ọ we rue ri'ọńu na obi-utọ ebigh-ebi, site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Prayer fior the Queen's Majesty
Ekpere n'ihi Governor-General, Governor, na Ndi Chief.

Chineke, Onye Nke puru irne ihe nile, Onye di ndu ebigh-ebi, Okwu nsọ Gi ziri ayi, na obi nke ndi eze di n'ọchichi na nchikọ nke Gi, na I nedozi ha neme kwa ka ha chigharia ka o si kasi nma n'anya amam-ihe Gi ka Chineke: Avi were obi di ume-ala nariọ Gi ka I si otu a dozie obi oru-Gi bu Governor-General, na nke Governor akuku Nigeria ayi bi nime ya, na nke Ndi Chief na Ndi Okenye, ka nime echiche-ha na okwu-ha na ọlu-ha nile, ka ha nachọ-gide nsọpuru na otuto nke Gi mgbe nile; ka ha jisi kwa ike ichebe ndi nke Gi I nyere ha n'aka, n'ọdi nma, na udo, na iyi-Chineke: Kwere nka, Nna nke ebere, n'ihi Ọkpara-Gi I huru n'anya, Jisus Kraist, bu Onye-nwe-ayi. Amen.
 

 
Ekpere n'ihi Prime Minister na ndi nile ọzọ nachi isi.

Chineke, Nke puru ime ihe nile, Nna ayi nke elu-igwe, Onye nani Gi nachi ala-eze nke madu, neme ka ihe nile di ka o si di uche ọma Gi nma; Ayi nariọ Gi ka I gọzie Onye isi Obobo ayi bu Prime Minister, na Premier nke akuku Nigeria ayi bi nime ya na Premier ndi ọzọ ga, na ndi Minister nke obodo ayi, na ndi nile naga nzukọ uku ebe aneme iwu nachi obodo ayi. Ka aka dike Gi nāchi ha; me kwa ka obi ha juputa n'ihu iwu Gi n'anya, na ezi omume na ihe nenye ndu. Ka ife Gi ofufe na idi uchu nime ya, na udo na idi n' otu, na ezi okwu na ikpe ziri ezi we di sie ike n'etiti ayi we rue na ndudugandu ayi nile; site na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, Amen.
 

 
Ekpere n'ihi Clergy na ọra madu nọ n'aka-ha.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nání Gi nēme ihe-ebube di uku; Zite Mọ amara-Gi Nke nēnye ezi ndu ka Ọ biakwasi Ndi-bishop-ayi, na Ndi-ozízí nile, na Nzukọ madu nile etiyere n'aka-ha; ka ha we nēme ihe gātọ Gi ezi utọ, wukwasi ha igirigi ngọzi-Gi mbe nile. Kwere nka, Onye-nwe-ayi, n'ihi nsọpuru nke Ọnu-nēkwuru-ayi, bú Jisus Kraist, Onye-obubo nke ayi. Amen.
 

Prayer for Clergy & people
Collect ma-ọbu Ekpere n'ihi Ọnọdu di iche iche nke madu nọ n'uwa, nke agāgu na mbe anākagh igu Litany.

Chineke, Onye kere madu nile, na Onye chebere ndu, ayi nāriọ Gi ri'obi di ume-ala n'ihi aha di iche iche na ọnọdu di iche iche nile nke madu nọ n'uwa; ka ọ tọ Gi ime ka ha mara uzọ-Gi nile, na ime ka mba nile mara ezi nzọputa-Gi. Nke ka uku, ayi nēkpere Gi n'ihi ezi ọnọdu nke Nzuko Catholick nke Kraist; ka ezi Mọ nke Gi si otú a nēdu ya, nāchi ya, ka ndi nile kwuputara n'iru ọra madu, kpọ onwe-ha Ndi Kraist, ka ewe duba ha n'uzọ nke ezi-okwu, ka ha we jide okwukwe-ha n'idi-n'otù nke mọ, na n'ihe-njikọ nke bu udo, na n'ezi omume nke ibi-obi-ha. Nke ikpe-azu, ayi aranye n'aka obi-orna-Gi na Nna ndi nile nwere ka ha si nodu n'ahuhu ma-ọbu na nkpa, n'uche-ha, ma-ọbu n'aru-ha, ma-ọbu n'ọnọdu-ha:
*Nka ka agāgu mbe madu nacho Ekpere nke Nzukọ.
[*nke ka uku ndi nke anāchọrọ ekpere-ayi,] ka ọ tọ Gi utọ ka I kasie ha obi, yere ha aka, ka nkpa-ha si di iche iche, nēnye ha ntachi-obi nime ihe nēbu ha nbu, na ezi nputa n'ahuhu nile nke ha. Nka ka ayi nāriọ Gi n'ihi Jisus Kraist. Amen.
 

The following two prayers do not appear in the 1662 BCP. They may be similar to the Prayer for All Conditions of Men and the General Thanksgiving, found in the US 1892 and 1928 BCP's.
Ekele bayere ihe nile.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nna nke ebere nile, ayi ndi-orù-Gi nēkwesigh ekwesi, ayi ekele Gi ekele nke obi di ume-ala, nke si kwa n'obi-ayi puta, bayere ezi ihe nile na obi-ọma nile nke I mere ayi, na madu nile;
*Nka ka agāgu mbe madu ekpe-woro ekpere bayere ha nachọ ka ha kele ekele.
[*nke ka uku bu nke I mere ndi nāchọ ubu a ka ha to Gi kele kwa Gi ekele bayere ebere nke I wedatara Onwe-Gi mere ha nādigh anya,] Ayi nagọzi Gi n'ihi okìkè I kere ayi, na nchebe I chebere ayi, na ngọzi nile nke ndu nka; ma nke kasi ha nile, n'ihi ihu-n'anya-Gi nke anāpugh iru ọnu, nke I ji baputa uwa site n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; n'ihi uzọ di iche iche I si enye amara, na n'ihi olile-anya nke otuto. Ayi nāriọ kwa Gi, ka I me ka ayi si otú a mata ebere-Gi nile, ka obi-ayi we juputa n'ekele nābugh nke nrafu, ka ayi we nēgosi otuto-Gi n'iru ọra, ọ bugh náni n'ebubere-onu-ayi, ma n'ibi-obi-ayi kwa; site n'irara onwe-ayi nye n'ifè Gi, site kwa n'ijeghari n'iru Gi ri'idi-nsọ na ezi omume ubọchi nile nke ayi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Onye nsọpuru nile na otuto diri, yere Gi na Meọ Nsọ, we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

 
Ekpere nke Saint Chrysostom.

Chineke Nke puru irne ihe nile, Onye nyeworo ayi amara ubu a ka ayi were otù obi bute aririọ-ayi n'iru Gi nọbọ; Gi Onye kwere si na mbe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aha-Gi I gānu aririọ-ha; Onye-nwe-ayi, mezue ọchichọ na aririọ nke ndi-orù-Gi ubu a, otú ọ gādichasiri ha ezi nma; nye ayi ọmuma nke ezi-okwu-Gi n'uwa nka, na ndu ebighhebi n'uwa nke nābia, Amen.

2 Ndi Korint 13.

Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere ayi nile mbe nile. Amen.

Prayer of St. Chrysostom


Return home

Web author: Charles Wohlers U. S. EnglandScotlandIrelandWalesCanadaWorld