![]() |
The Book of Common Prayer | ||||||
|
|
LITANY N'ebe a ka LITANY, ma-ọba Arirọ nke ike nile, nēso, nke aganābù ma-ọbu nāgu ma Ekpere Ututu gasia n'ubọchi Sunday, na Wednesday, na Friday, na mbe ọzọ otú Bishop ma-ọbu onye nọchiri anya ya gēnye ya n'iwu. Chineke Nna nke elu-igwe: mere ayi ebere, ayi ndi-nmehie
ndi di imere ebere. Chineke Ọkpara, Onye-nbaputa nke uwa: mere ayi ebere, ayi ndi-nmehie
ndi di imere ebere. Chineke Mọ Nsọ, Onye si na Nna na Ọkpara puta: mere
ayi ebere, ayi ndi-nmehie ndi di imere ebere. Chineke Mọ Nsọ, Trinity, Nke di nsọ, di ngọzi, di ebube, Nke di Ndi ato
ma otù Chineke: mere ayi ebere, ayi ndi-nmehie ndi di imere ebere. Onye-nwe-ayi, echetala ajọ omume-ayi, ma-ọbu ajọ omume
nke nna-ayi ochie-hà: abọla ọbọ nke nmehie-ayi:
rapu ayi, ezi Onye-nwe-ayi, rapu ndi nke Gi, ndi I jiworo ọbara-Gi
kasi oké ọnu baputa, ewesala ayi iwe mbe ebigh-ebi. N'ajọ ihe na ilu-aru nile; na nmehie, n'aghughọ na nmegide
nile nke ekwensu; n'iwe-Gi, na n'ọmuma-ikpe ebigh-ebi, N'ìsì obi nile; na nganga na inya-isi na iru-abua; n'ekworo
na ikpọ-asì na idebe-iwe, na n'ejigh ihu-n'anya nile, N'ikwa-iko na nmehie ọzọ nile nēbute ọnwu: na
nrafu nile nke uwa na anu-aru na ekwensu, N'amùmà-igwe na oké ifufe; n'ajọ ọria
na ajọ oria nēfe efè na unwu; n'agha na ọchu,
na n'ọnwu mberede, N'ikpasu-ogù nile na iba ajọ izù nzuzo na inupu
isi n'okpuru ndi-isi; n'ihe-ozizí ugha nile na irọ-òtù na
nkewa; n'obi ike na ileda Okwu-Gi na iwu-Gi anya, Site n'ihe-omimì nke Ighọ-madu I ghọrọ nke
di nsọ; site n'Ọmumu-Gi na Obibi-úgwù-Gi di
nsọ; site na Baptism-I na Obubu-ọnu-Gi na Ọnwunwa-Gi, |
The Litany |
Site na Nbu o buru Gi ri'obi na Ọsusọ-ọbara-Gi:
site n'Obe nke Gi na Ihu-ahuhu-Gi; site n'Ọnwu-Gi di oke ọnu
na Òlìlì-Gi: site na Nbilite-n'ọnwu-Gi di
ebube, na Nrigo-n'elu-igwe-Gi; site kwa n'ọbibia nke Mọ Nsọ. Na mbe nile nke ahuhu-ayi; na mbe nile ọ diri ayi nma; na mbe ọnwu,
na n'ubọchi ikpé, Ayi ndi-nmehie nāriọ Gi ka I nuru olu-ayi, Onye-nwe-ayi Chineke;
ka Ọ di Gi nma ka I nāchi Nzukọ Nsọ Gi di ri'ebe
nile nēdu, kwa ya n'uzọ ziri ezi; Ka Ọ di Gi nma ka I debe orù-Gi ELIZABETH, bú Eze-nwayi-ayi
na Onye-isi-ayi nwere obi-ọma, ka I nye kwa ya ike ikpere Gi n'ezie,
n'ibi-obi ezi omume na nke di nsọ; Ka ọ di Gi nma ka I nachi obi oru-Gi bu Governor-General nke ala
nka, ya na Governor nke akuku Nigeria ayi bi nime ya, ka I me ka ha kwere
na Gi, tukwa egwu Gi, ka ha we hu Gi n'anya, we tukwasi Gi obi mgbe nile. Ka ọ di Gi nma ka I were ezi ọmuma na nghọta nke Okwu-Gi
nye Ndi-bishop na Ndi-presbyter na Ndi-deacon nile ìhè;
ka ha weputa Okwu ahu n'iru ọra madu, gosi kwa ya otú ọ di
site n'ihe-ozizi-ha na ibi-obi-ha; Ka ọ diGi nma ka I nye ndi Minister obodo, na ndi naga Nzukọ uku
ebe aneme iwu nachi obodo ayi, na ndi Chief, na ndi nile nachi achi n'ala
nka, amara na amam-ihe na nghọta. Ka ọ di Gi nma ka I buru Onye nedu ndi-ikpe na ndi magistrate,
nenye ha amara ime nma nye madu nile, natugh egwu, nelegh madu anya n'iru,
nejigh aghughọ ma-obu obi ọjọ. Ka ọ di Gi nma ka I gọzie ndi-Gi nile, debe kwa ha; Ka ọ di Gi nma ka I nye mba nile idi-n'otù, na udo, na
otù obi; Ka ọ do Gi nrna ka I nye ayi obi ihu Gi n'anya, na itu egwu Gi,
na ijisi ike ibi obi dika ihe nile I nyere n'iwu si di; Ka ọ di Gi nma ka I nye ndi-Gi nile amara n'uba ka ha were nwayọ nānu
Okuwu-Gi, ka ha were obi ihu-ri'anya nara ya, ka ha mia nkpuru nke Mọ Nsọ; |
|
Ka ọ di Gi nma ka I kpọbata nime
uzọ ezi-okwu ndi nile jehiere ejehie, ndi arafuru arafu; Ka ọ di Gi nma ka I nye ndi guzoro eguzo ike; ka I kasie ndi ume
nādigh n'obi, ka I yere ha aka; ka I palie ndi nke dara ada; n'ikpe-azu
ka I tid a Setan n'okpuru ukwu-ayi; Ka ọ di Gi nma ka I bakute ndi nile nọ n'ebe ize-ndu ma-ọbu
na nkpa ma-ọbu n'ahuhu, ka I yere ha aka, kasi kwa ha obi; Ka ọ di Gi nma ka I chebe ndi nile nọga ije n'ukwu-ala ma-ọbu
na miri, na ndinyom nile ime nēme, na ndi-ọria nile, na umu-ntakiri,
ka I mere ndi nile nọ n'ulo-nkpọrọ na ndi adọtara
n'agha ebere; Ka ọ di Gi nma ka I luara umu-nbei ọgù, ha na ndinyom
di-ha nwuru, na ndi nile nēnwegh ikwu na ibe anēmebu, ka I
boro ha nkpa; Ka ọ di Gi nma ka I mere madu nile ebere; Ka ọ di Gi nma ka I baghara ndi-iro-ayi, na ndi nēsobu ayi,
na ndi nēkwulu aha-ayi, ka I me kwa ka obi-ha chigharia; Ka ọ di Gi nma ka I nye ayi nkpuru nke ala di iche iche, ka I
chebere ayi ha, ka ọ gābu, mbe ubọchi-ha ruru, a yi
erie ha; Ka ọ di Gi nma ka I nye ayi ezi ncheghari; ka I baghara ayi nmehie-ayi
nile, na ihe ayi rapuru ime, na nke ayi mere n'amagh-ama; ka I were kwa
amara Mọ Nsọ nke Gi yikwasi ayi dika uwe, ka ayi we dozie
ibi-obi-ayi ka Okwu nsọ Gi si di; Ọkpara Chineke: ayi nāriọ Gi ka Inurn olu-ayi. Nwa-aturu Chineke: Onye nēbupu nmehie nke uwa. Nye ayi udo-Gi.
Nwa-aturu Chineke: Onye nēbupu nmehie nke uwa. Nye ayi udo-Gi.
Kraist, nuru olu-ayi. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere. Kraist, mere ayi ebere. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere. Emesia, Presbyter na pra madu gāgukọ Ekpere
nke Onye-nwe-ayi. |
|
Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka aha-Gi di nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. Baghara ayi ihe ọjọ nile ayi mere, otú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ. Edubala ayi nime ọnwunwa; Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe. Amen. Presbyter. Onye-nwe-ayi, emesola ayi ka nmehie-ayi
si di. Ka ayi kpere Chineke. Chineke, Nna Nke di ebere, Onye nādigh-eleda ize-ume nke obi nākwa
nmehie, ma-ọbu ọchichọ nke ndi nero újú;
Were ebere yere ayi aka n'ekpere-ayi nke ayi nēkpe n'iru Gi nime
ahuhu-ayi nile na ihe nile nēmegide ayi, rnbe ọ bula ha nēmebu
ayi; were amara nuru olu-ayi, ka ihe ọjọ nile nke aghughọ na
nyibu nke ekwensu ma-ọbu madu nāgho megide ayi we la n'efu:
ka ha basasia site n'iburo-uzọ-hu-ihe obi-ọma-Gi nāhu:
ka ayi, bú ndi-orù-Gi, ebe ọ nādigh nsobu ọ bula
nēmeru ayi aru, ka ayi we nēkele Gi mbe nile nime Nzukọ nsọ Gi;
site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi
akukọ ọlu ebube nile nke I luru n'ubọchi-ha, lu kwa
na mbe ochie buru ha uzọ. Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ; Kraist, bopuru ayi ndi-iro-ayi. Were ebere lekwasi anya n'iru-újú nke obi-ayi. Were amara na ebere nuru ekpere-ayi. |
Lord's Prayer |
Kraist, ubu a na mbe nile wedata Onwe-gi
ka I nuru olu-ayi. Presbyter. Onye-nwe-ayi, me ka ahú ebere-Gi u'aru ayi; Ka ayi kpere Chineke. Nna-ayi, ayi ji obi di ume-ala ariọ Gi, ka I were ebere lekwasi adigh-ike nke ayi anya ; ri'ihi otuto Aha-Gi wepu ri'isi-ayi ihe ọjọ nile nke kwesiri ayi n'ezie; nime ahuhu nile nke ayi, kwe ka ayi tukwasi obi-ayi nile n'ebere-Gi, dabebere kwa ya, we nēfè Gi òfùfè mbe nile n'ibi-obi di nsọ di ọcha, ka nsopuru na otuto we diri Gi; site na nání otù Onye-obubo-ayi na Ona nēkwuru-ayi, Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen. Ekpere nke Saint Chrysostom. Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye nyeworo ayi amara ubu a ka ayi were otu obi bute aririọ-ayi n'iru Gi n'ọbọ; Gi Onye kwere si na mbe madu abua ma-obu atọ zukọworo n'aha-Gi I gānu aririọ-ha; Onye-nwe-ayi, mezue ọchichọ na aririọ nke ndi-orù-Gi ubu a, otú ọ gādichasiri ha ezi nma: nye ayi ọmuma nke ezi-okwu-Gi n'uwa nka, na ndu ebigh-ebi n'uwa nke nabia. Amen. 2 Ndi Korint 13. Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere ayi nile mbe nile. Amen. N'ebe a lea Litany ruru. |
Return home
Web author: Charles Wohlers | U. S. • England • Scotland • Ireland • Wales • Canada • World |