H
flag of Nigeria The Book of Common Prayer
United States England Scotland Ireland Wales Canada World

 
    Ekpere Na Abu
The Book of Common Prayer in Igbo

 

USORO NKE INYE
NRI·ANYASI NKE ONYE-NWE-AYI

MA-ỌBU

ORIRI NSỌ.


Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha buru ndi-nketa Oriri Nsọ ha gāgwa Curate aha-ha, otú ọ di n'ubọchi tọrọ ubọchi ahu.

Ọ buru kwa na onye ọ bula nime ha bu onye amara aha-ya na o nēbi obi ọjọ n'iru ọra madu, ma-ọbu na ọ mere madu-ibe-ya ajọ ike n'okwu ma-ọbu n'omume, we mejọ Nzukọ site na ya; mgbe Curate mara nka, ọ gākpọ ya, ọ gādu ya ọdu, ka ọ ghara izọbà ukwu ma-ọbu ibia na Tebel nke Onye-nwe-ayi, we rue mgbe o kwuputara n'iru ọra madu si na ya echeghariwo obi ezie, na ya edoziwo ibi-obi ọjọ ya nke-ochie, ka afọ we site na ya ju Nzukọ nke ọ mejọrọ: mbe o kwuputa-kwa-ra si na ya akwughachiwo ndi ahu ọ mere ike ọjọ: ma-ọbu otú ọ di o kwuputa si na ya zubere si ike ime otú a mbe ọ bula ọ di ya oghere.

Otu aka ahu ka Curate gēso n'aru ndi ọ kuru na idebe-iwe na ikpọ-asi di n'etiti ha; ọ gagh-ekwe ka ha buru ndi-nketa nke Table nke Onye-nwe-ayi, we rue mbe ọ mara na ha di n'otú. Ọ buru kwa na otù nime ndi nēse okwu ekwere na ya gēsite n'ala obi-ya baghara ike ọjọ nile nke ibe-ya mehiere ya, na ya gēmesi n'ihi ike ya onwe-ya.mejọrọ; ọ buru kwa na ibe-ya agagh-ekwere ka ha di n'otu dika ọ kwesiri ndi Chineke, kama ọ nọgide nime isi-ike-ya idebe-iwe-ya: n'okwu di otú a, ọ kwesiri ka Minister kpọbata onye cheghariri n'Oriri Nsọ, ghara kwa onye-isi-ike. Ma Minister ọ bula nke gāchupu madu otú ekwuru n'ebe a ma-ọbu otú ekwuru na Paragraph nke Rubric nka nke buru uzọ, ọ ghagh ikọrọ Bishop okwu ahu, tutu ubọchi iri na anọ agabigasia. Bishop gēme onye ahu mehiere otú ọ di na Canon.

Na mbe Oriri Nsọ Table gēguzo n'etiti Ulo Chineke, ma-ọbu na Chancel, eke akara àkà ka anāgu Ekpere Ututu na Anyasi, agēwere ákwà ọcha ọma kpukwasi ya. Presbyter gēguzo n'akuku Ugwu nke Table, ọ gāgu Ekpere nke Onye-nwe-ayi, ya na Collect so ya, madu nile gēbu ikpere n'ala.
 

The Lord's Supper, or

Holy Communion

Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka aha-Gi di nsọ, Ka ala-eze-Gi bia. Ka erne ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. Baghara ayi me ọjọ nile ayi mere. Ofú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ. Edubala ayi nirne ọnwunwa: Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe. Amen.
 
Lord's Prayer

Collect.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Gi Onye obi nile ghere oghe n'iru Gi, Onye mara ọchichọ nile, na Onye anādigh-ezo ihe-nzuzo ọ bula n'anya-Gi; Sacha èchichè nke obi-ayi site n'ikuye-urne nke Mọ Nsọ Gi, ka ayi we hu Gi n'anya nke-ọma, we bulie Aha Nsọ Gi ka o si kwesi; site na Kraist, bu Onye-nwe-ayi. Amen.

Agusia, Presbita gēche ọra madu iru, ọ gēwere olu ike gua IWU IRI nile; ọra madu gēbugide ikpere n'ala. Agusia Iwu ọ bula, ha gāriọ Chineke ebere n'ihi njehie ha jehiere n'Iwu ahu na mbe gara aga, ha gāriọ kwa amara idebe ya na mbe di n'iru, dilea o si so.
 

Collect for Purity

Minister.

Chineke kwuru okwu ndia, si, Mu onwem bu Jehova Chineke-gi: Gi enwela chi ọzọ tiyerem.

    Ọra madu, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa: gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asi; ma anamemere nnù unu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi ime ihe efu; n'ihi na Jehova agagh-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmagh.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, ubọchi isi ka i gālu ọlu, je ozi-gi nile: ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gagh-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime onu-uzọ-ama-gi ọ bula: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Gi ebula madu.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Gi akwala iko.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru edibe iwu nka.
    Minister. Gi ezula ori.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Gi abala àmà ugha megide madu-ibe-gi.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, do obi-ayi iru idebe iwu nka.
    Minister. Gi enwela anya-uku n'ebe ulo madu-ibe-gi di, gi enwela anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi no, ma-ọbu n'ebe orù-ya nwoke nọ, ma-ọbu n'ebe oru-ya nwayi no, ma-obu nebe ehi-ya di, ma-ọbu n'ebe inyinya-ibu-ya di, ma-ọbu n'ebe ihe ọ bula di nke madu-ibe-gi nwere.
    Ọra madu. Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, de iwu-Gi nile ndia n'obi-ayi, ayi nāriọ Gì.
 

Ten Commandments

 

(Prayers for the Queen are omitted).

Agusia, agāgu Collect nke Ubọchi ahu. Ngwa ngwa agusia Collect, Presbyter gāgu Akwukwọ-ozi, si, Edere Akwukwọ-ozi [ma-ọbu, Òke nke Akwukwọ Nsọ akara àkà ka ọ buru Akwukwọ-ozi] n'Isi —— nke —— malite o'Ama-okwu ——. Agusia Akwukwọ-ozi, ọ gāsi, N'ebe a ka agāgubì Akwukwọ-ọzi. Agusia, ọ gāgu Ozi Ọma (madu eguzosia ọtọ) si; Edere Ozi Ọma di nsọ n'Isi —— nke —— malite n'Ama-okwu ——. Agusia Ozi Ọma, agābù ma-ọbu. gua Okwukwe nke so, ọra madu gēguzogide ọtọ, dika mbu.
 

Readings

Ekwem n'otù Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile, Onye kere elu-igwe na uwa, Na ihe nile anya nāhu, na nke anya nādigh-ahu:
    Ekwem n'otù Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Ọkpara Chineke muru náni Ya, Onye Nna-Ya mutara tutu uwa nile adi, Chineke Nke putara na Chineke, Ìhè Nke putara n'Ìhè, Ezi Chineke Nke putara n'ezi Chineke, Onye amutara amuta, ma ekegh Ya ekè, Onye Ya na Nna bu otù udi; Onye esitere n'aka-Ya we kè ihe nile, Onye si n'elu-igwe ridata, n'ihi ayi, bú madu, na n'ihi nzọputa-ayi, Onye yiri anu-aru madu site na Mọ Nsọ nke aru Nwa-abọghọ nāmagh nwoke, bú Meri, Ewe me Ya madu, Akpọgide kwa Ya n'obe n'ihi ayi n'ubọchi Pọntiọs Pailet. Ọ hu ahuhu, elìe Ya, N'ubọchi nke-atọ O siri n'ọnwu bilite ọzọ dika Akwukwọ Nsọ si kwu, Ọ rigoro n'elu-igwe, Ọ nānọdu n'aka-nri Chineke, bú Nna. Ọ gābia kwa ọzọ n'otuto ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu: Onye ala-eze-Ya nāgagh-enwe ọgwugwu.
    Ekwekwam na Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayí, na Onye nēnye ndu, Onye si na Nna na Ọkpara puta, Onye anēkpere nēto kwa Ya na Nna na Ọkpara n'ọbọ, Onye kwuru okwu site n'ọnu Ndi-arnuma, Ekwekwam otù Nzukọ Katolik nke nēso Ndi-ozi. Ekwem otù Baptism n'ihi nbaghara nmehie. Anamele kwa anya Nbilite-n'onwu nke ndi nwuru anwu, Na ndu nke uwa gābia abia. Amen.

Agusia, Curate gāgwa ọra madu Ubọchi Nsọ, ma-ọbu Ubọchi Obubu-ọnu, di n'Izu so ya nke agēdebe. Mbe ahu kwa (ọ buru na oge erue) agāma ọkwa Oriri Nsọ; agāgu kwa Akwukwọ nile nke ima ọkwa, na Idechapu aha madu. Agagh-ama ọkwa ọ bula, agagh-ekwuputa kwa ike ọ bula nime Ulo Chineke na mbe nzukọ ikpere Chineke, ma-ọbugh. site n'ọnu Minister: ma ya onwe-ya agagh-ekwuputa ike ọ bula, ghara ike akara àkà n'Iwu Akwukwọ nka, ma-ọbu nke Eze ma-ọbu Bishop ebe ahu nyere n'iwu.

Emesia, ikwu Okwu Chineke gēso, ma-ọbu otù nime Homily edeworo n'akwukwọ site n'aka ndi-isi, ma-ọbu nke agēde n'akwukwọ n'ọdi-n'iru.

Emesia, Presbyter gēchigharikute Table nke Onye-nwe-ayi, malite lewa Onyinye ọ gāgu otù nime ama-okwu ndia so ma-obu gukaria otu, ka o si chè n'uche-ya na ọ kwesiri.
 

Nicene Creed

Otú a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.   Matiu 5. 16.

Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori: kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādigh-erichapu, ebe ndi-ori nādigh-egwupú kwa, ha adigh-ezu kwa ori.   Matiu 6. 19,20.

Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.   Matiu 7. 12.

Ọ bugh onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gāba n'ala-eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ.   Matiu 7. 21.

Zakiọs we guzo, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-obeye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha m'gēnyeghachi anọ anọ.   Luk 19. 8.

Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mbe ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādigh-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù igwè aturu, nādigh-eri kwa ihe putara na miri-ara igwè aturu ahu?   2 Ndi Kọrint 9. 7.

Ọ buru na ayi onwe-ayi ghara ihe nke Mọ Nsọ dika nkpuru nye unu, ọ bu ihe uku rna ọ buru na ayi onwe-ayi gēwere ihe nke anu-aru unu dika ihe-ubi?   1 Ndi Kọrint 9. 11.

Unu amatagh na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-aja nēso ebe-ichu-aja ahu nēkekọ ihe? Ọbuná otú aka Onye-nwe-ayi kara àkà. kandi nēkwusa ozi ọma Ya si n'ozi ọma ahu di ndu.   1 Ndi Kọrint 9. 13, 14.

Onye were aka-ntagide nāgha nkpuru gēwere kwa aka-ntagide nēwe ihe ubi; onye were kwa ngọzi nāgha nkpuru gēwere kwa ngozi newe ihe ubi. Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya: ọ bugh site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi utọ nēnye n'anya.   2 Ndi Kọrint 9. 6,7.

Onye ewere okwu ọnu nēzi okwu Chineke, ya me ka onye nēwere okwu ọnu nēzi ya so ya nēnwekọ ezi ihe nile. Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abugh onye anēleli: n'ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n'ubi.   Ndi Galetia 6. 6, 7.

Otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzi-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.   Ndi Galetia 6. 10.

Nsọpuru Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku: n'ihi na ayi awetagh ihe ọ bula n'uwa, ọ bu kwa n'ihi na ayi apugh iwere ihe ọ bula pua nime ya.   1 Timọti 6. 6,7.

Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ubu a iwu, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe; ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n'ezie.   1 Timọti 6. 17-19.

Unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nweko ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.   Ndi-Hibru 13. 16.

Onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, ọ we mechigide ya obi-ebere-ya, ihu-n'anya Chineke si ana digide nime ya?   1 Jọn 3. 17.

Were nime ihe i nwere me amara, ewepula iru-gi n'aru obeye ọ bula mbe ọ bula; mbe ahu agagh-ewepu kwa iru Onye-nwe-ayi n'aru gi.   Tobit 4.

Me ebere ka ike-gi ra. I nwe ihe ri nne, nye ri nne; i nwe nke-ntà, were ọnu jisie ike nye nime nke-ntà ahu: n'ihi na otú a i nākpakọbara onwe-gi ezi ọkwukwu-ugwọ n'ubọchi nkpa.   Tobit 4.

Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnwegh ike amara bu, ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.   Ilu 19. 17.

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnwegh ike: n'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.   Abu Ọma 41. 1.

Ebe anāgu ama-okwu ndia, Ndi-deacon ma-ọbu Ndi-church-warden, ma-obu madu ọzọ kwesiri ekwesi, onye akara àkà bayere ọlu ahu, gānara onyinye agēkesara umu-obeye, na ihe ọzọ ọra madu nyere Chineke, nime ahere di nma, nke Nzukọ we ahu gāchọta bayere nka: ha gēwere naọpuru bute ya nye Presbyter, ka ọ were obi di ume-ala che ya n'iru Chineke dpkwasi kwa ya n'elu Table nsọ.

Mbe Oriri Nsọ di, mbe ahu Presbyter gādọkwasi Achicha na Manya-vine n'elu Table, otú ọ chere na o gēzu.
 

Offertory sentences

Emesia nka, Presbyter gāsi,

Ka ayi kpere Chineke n'ihi ọnọdu nile nke Nzukọ Kraist nālu ọgù n'uwa nka.
    Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye di ndu ebigh-ebi, Onye siteworo n'onu Onye-ozi-Gi di nsọ zí ayi ka ayi nēkpe ekpere, nāriọ aririọ, nēkele kwa ekele, n'ihi madu nile; Ayi ji obi di ume-ala nāriọ Gi ka I were ebere uku Gi [*we nara onyinye na ihe-òfùfè nke ayi,]
Ọ buru na onyinye ma-ọbu ihe-ofufe adigh, mba ahu aga-ghara igu okwu ndia [we nara onyinye na ihe-òfùfè nke ayi].
nuru ekpere-ayi ndia, nke ayi chere n'iru Ebube Nsọ Gi bú Chineke; ayi nāriọ Gi ka I were mọ nke ezi-okwu na nke idi-n'otù na nke otù obi kuye ume mbe nile nime Nzukọ-Gi nke di n'elu-uwa nka dum: Kwe, ka ndi nile nke kwuputara Aha nsọ Gi we kwekọ ezi-okwu nke Okwu nsọ Gi, ka ha we biri n'idi-n'otu, ya na ihu n'anya nke Chineke. Ayi nariọ kwa Gi ka I nedu mba nile n'uzọ ezi omume na udo: Ka I neduzi Eze nile na Ndi-isi nile ka ewe nachi ndi nke Gi nọ n'okpuru ha n'uzọ Chineke na nwayọ kwa. Kwe ka oru Gi ELIZABETH bu eze-nwayi ayi na ndi nile arọputara ichi achi n'okpuru ya, ka ha were ezi-okwu na elegh-abya-n'iru nēkpe ikpe, n'inye ndi nēme ajo omume na idi-njọ ahuhu, na ikwagide ezi uzọ-Gi na idi nma. Nna-ayi nke elu-igwe, were amara nye Ndi-bishop nile na Ndi-curate nile, ka ha we chebe ezi Okwu-Gi nke di ndu n'iru ọra madu site n'ibi-obi-ha na ihe-ozizi-ha ka ha we nēkè kwa Sacrament nke Gi di nsọ n'uzọ ziri ezi na ka o si kwesi: Were kwa amara-Gi nke elu-igwe nye madu nile nke Gi; nke kariri nye nzukọ nka nọ n'ebe a; ka ha were obi di nwayọ na nsọpuru nke kwesiri ekwesi we nānu, nānara Okwu nsọ nke Gi; ka ha nēfè Gi òfùfè ezie n'idi-nsọ na ezi omume ubọchi nile nke ndu-ha. Onye-nwe-ayi, ayi were obi di ume-ala nke-uku nāriọ Gi n'ihi obi-ọma-Gi, ka I kasi, bakute kwa ndi nile nke nọ n'ahuhu, akwá obi, nkpà, ọria, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ nēmegide ha na ndu nka nāgabiga agabiga. Ayi nāgọzi kwa Aha nsọ Gi, n'ihi ndi-orù-Gi nile ndi rapuru ndu nka la n'okwukwe-Gi na egwù-Gi: ayi nāriọ Gi ka I nye ayi amara ka ayi si otú a nēso ezi ije-ukwu nke ha, ka ayi soro ha we buru ndi-nketa nke ala-eze elu-igwe nke Gi: Kwere nka, Nna-ayi, n'ihi Jisus Kraist, nání otù Onye-obubu na Ọnu-nēkwuru ayi. Amen.
 

Prayer for Christ's church militant

Mbe Minister nāma ọkwa na agēnye Oriri Nsọ, (nka ka ọ ganēme mbe nile n'ubọchi Sunday, ma-ọbu n'Ubọchi. nsọ ọzọ nke buru uzọ ngwa ngwa,) mbe ekwusiri Okwu Ohineke ma-ọbu Homily, ọ gāgu Idu-ọda nku nke so.

Ndi m'huru n'anya ezie, n'ubọchi —— ọzọ gābia, ezuberem, site n'iye-aka Chineke, inye otú ndi nile were egwù Chineke na nsọpuru-Ya jikere n'obi-ha Sacrament nke Aru na Ọbara Kraist nākasi obi karisia ihe nile, ka ha nara ya we cheta Obe na Ihu-ahuhu-Ya di oké ọnu; nke ayi ji náni ya nānata nbaghara nmehie-ayi, ewe me ayi ndi-nketa Ala-eze nke elu-igwe. N'ihi nka, ọ bu ọlu-ayi ikele Chineke Nke puru ime ihe nile, bú Nna-ayi nke elu-igwe, ekele nke obi di ume-ala na nke si n'obi-ayi puta, nihi na Ọ nyere Ọkpara-Ya Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, ọ bugh nání inwuru ayi ọnwu, ma ka Ọ buru kwa nri na ihe gāzù mọ-ayi nime Sacrament ahu di nsọ. Ebe ọ bu ihe nke Chineke na ihe nkasi-obi n'ebe ndi kwesiri ekwesi we nara ya nọ, na ebe ọ bu kwa ihe ize-ndu n'ebe ndi gēwebà onwe-ha inara ya u'ekwesigh ekwesi nọ; ọ bugh ọlum idu unu ọdu tutu oge erue, ka unu chigharia ebube nke ihe-omimi ahu di nsọ n'obi-unu, ya na ihe-egwù uku nke diri inara ya n'ekwesigh-ekwesi; ka unu si otú a nyocha akọ-n'uche nke unu ledo kwa ha, (unu eme-kwa-la nke ahu dika ihe ọchì, dika ndi nēmeso Chineke n'uzọ aghughọ; ma menu ya n'uzọ di otú ahu) ka unu we bia di nsọ, di kwa ọcha, n'Oriri elu-igwe di otú a, yiri uwe ọlulu-di nke Chineke nāchọ nime Akwukwọ Nsọ, ka ewe kpọbata unu dika ndi kwesiri iketa Table nsọ ahu.
    Uzọ na otú esi me ya bu nka; Mbu, ka unu were ihe-ọtùtù, nke bu iwu Chineke, we ledo omume-unu na ibi-obi-unu; n'ihe ọ bula unu huru na unu emejọwo, site n'ọchichọ, ma-ọbu n'okwu, ma-ọbu n'omume, n'ebe ahu kwanu akwá nmehie-unu, kwuputa-kwa-nu nmehie-unu nile gwa Chineke Nke puru ime ihe nile, jikere ezie idozi ibi-obi-unu. Ma ọ buru na unu ahu si na nrnejọ-unu di otú ahu na ọ bugh náná Chineke ka ha nēmegide, ma ha megide-kwa-ra madu-ibe-unu; mbe ahu unu gēme ka unu na ha di n'otù: unu gējikere ikwughachi ọzọ na imezi, otú ike-unu ra, n'ihe iru-aru na ajọ ihe nile nke unu mere onye ọ bula ọzọ; unu gējikere kwa ibaghara ndi ọzọ mejọrọ unu, otú unu si chọ nbaghara nmejọ-unu n'aka Chineke: n'ihi na ọ buru na ọ digh otú a, inara Oriri Nsọ ahu agagh-emere unu ihe ọzọ ghara ime ka ọmuma-ikpe-unu ba uba. Ya mere ọ buru na onye ọ bula nime unu bu onye nēkwulu Chineke, onye nēbochi, ma-ọbu onye nēkwutọ Okwu-Ya, onye nākwa iko, ma-ọbu onye nēdebe iwe, ma-ọbu onye nēkwo ekworo, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ uku ọ bula ọzọ, chegharianu uche bayere nmehie-unu, ma unu emegh ya, unu abiala na Table nsọ ahu; ka ọ ghara ibu mbe unu narasiri Sacrament nsọ ahu, ekwensu abà nime unu, dika o si ba nime Judas, ọ me ka unu juputa n'ihe ọjọ nile, ọ bia weta unu na nbibi nke aru na nkpuru-obi.
    N'ihi na ọ bu ihe di nkpa ka onye ọ bula ghara ibia n'Oriri Nsọ, ma ọ bugh na ọ nwere ezi ntukwasi-obi n'ebere Chineke, nwe kwa akọ-n'uche nke nọ nwayọ: ya mere ọ di onye ọ bula nime unu nke nāpugh ime ka akọ-n'uche-ya nọdu nwayọ nime okwu nka n'ime ihe ndia, ma ọ nāchọ nkasi-obi na ndum-ọdu ọzọ, ya biakutem, ma-ọbu ya jekuru onye ọzọ nēkwu Okwu Chineke, bú onye mara ihe, nwe kwa uche, ka o kpughere ya ihe nēwuta ya n'obi; ka ọ we site n'ikwu Okwu nsọ nke Chineke nata urù nke ntọpu-nmehie, ya na idọ-aka-na-nti na ndum-ọdu nke mọ, ka akọ-n'uche-ya we nọdu nwayọ, nāze kwa itu-egwu na iche-nile ọzọ.

Ma-ọbu, ọ buru na ọ hu na ndi ahu adigh-ana nti ibia n'Oriri Nsọ, ọ gāgu Ndum-oda nka n'ọnọdu Ndum-ọdu nke-mbu.

Umu-nnam m'huru n'anya nke-uku, n'ubọchi —— ezuberem, site n'amara nke Chineke, inye oriri Nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi: n'ọnọdu Chineke akpọm unu nile ndi nọ n'ebe a ka unu bia na ya; ariọkwam unu, n'ihi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka unu ghara iju si na unu agagh-abia na ya, ebe akpọrọ unu n'ihu-n'anya, site n'ọnu Chineke Onwe-ya. Unu amawo ka o si buru ihe di njọ na ihe enwegh-ekele, mbe madu sichasiri oriri uku, kpojue nri nile di iche iche na table-ya, ọ we ghara ifọdu ihe ọ bula ma-ọbugh ka ndi akpọrọ nọdu ala; rna ndi akpọrọ (ọ bu ezie na ihe ebochigh ha) ma ha were ekelegh-ekele nke-uku ju si na ha agagh-abia. Ònye nọ nime unu nāgagh-ewe iwe n'ihe di otú a? Ònye nāgagh-echè na emeruru ya aru mejọ kwa ya? Ya mere, ndi m'huru n'anya nke-uku ezie nime Kraist, lezienu anya nke-oma, ka unu ghara ikpasu iwe nke Chineke megide onwe-unu, n'isepu onwe-unu na Nri-anyasi nsọ nka. Ọ bu ihe di nfe ka madu si, Agaghm-eri Oriri Nsọ, n'ihi na ọlu ọzọ nke uwa bochirim. Ma agagh-anara aririọ-nrapu di otú a ngwa ngwa, agagh-ekweye kwa ha n'iru Chineke. Ọ buru na onye ọ bula asi, Abum onye-nmehie nke-uku, n'ihi ya anamatu egwu ibia: gini me-kwa-ra unu adigh-echeghari, mezibe? Mbe Chineke kpọrọ unu, ihere emegh unu isi na unu agagh-abia? Mbe ọ kwesiri ka unu chigharikute Chineke, ùnu gāgu onwe-unu na ndi arapuru, ùnu gāsi na unu ejikeregh? Tugharianu obi-unu nke-ọma ka otú aririọ-nrapu ugha ndia nāgagh-esi ba n'ihe ọ bula n'iru Chineke. Ndi nke juru oriri nime Ozi Ọma n'ihi na ha zutara ubi, ma-ọbu n'ihi na ha nāchọ inwa ehi ọlu ha ejikọrọ abua abua, ma-ọbu n'ihi na ha luru nwunye, esigh otú a rapu ha, kama aguru ha na ndi nēkwesigh ibia n'oriri nke elu-igwe ahu. Mu onwem, m'gānọ na njikere; ọzọ, dika Ọnọdum si di, akpọm unu okú n'Aha Chineke, kpọ kwa unu n'ọnọdu Kraist, aduam unu ọdu, ebe unu huru nzọputa-unu n'anya, ka unu buru ndi-nketa n'Oriri nsọ nka. Dika Ọkpara Chineke si wedata Onwe-ya, ka Ọ rara nkpuru-obi-Ya nye site n'inwu onwu n'elu Obe n'ihi nzọputa-unu; ọ bu otú a ka o si buru ọlu-unu inara Oriri Nsọ we nēcheta àjà nke ọnwu-Ya, otú Ya onwe-ya nyere iwu: ma ọ buru na unu anagh nti ime nka, tugharianu obi-unu ka unu si emejọ Chineke nke-uku, ka ahuhu si di uku nke kwufere n'isi-unu n'ihi ya; mbe unu leziri anya weghachi onwe-unu na Table nke Onye-nwe-ayi, we keputa onwe-unu n'umu-nna-unu, bú ndi biara izù onwe-ha n'Oriri ahu nke bu nri elu-igwe n'ezie. Ihe ndia, ọ buru na unu atugharia ha nke-ọma nobi-unu, unu gēsite n'amara nke Chineke chigharia nwe uche ka nma: ayi agagh-arapu kwa iwere aririọ-ayi nke obi di ume-ala riọ Chineke, bú Nna-ayi nke elu-igwe, Nke puru ime ihe nile, ka unu we nara nka.

Na mbe iri Oriri Nsọ, edozisia Ndi-nketa n'ebe di nma ka ha we nara Sacrament nsọ, Presbyter gādu Ndum-ọdu nka.

Ndi m'huru n'anya ezie nime Onye-nwe-ayi, unu ndi jikere n'uche-unu we bia Oriri nsọ nke Aru na Ọbara nke Kraist, bú Onye-nzoputa-ayi, unu gātu-ghari obi-unu ka Saint Pọl si du madu nile ọdu ka ha lezie anya, nwa onwe-ha, nyocha onwe-ha, tutu ha etiye onwe-ha ibia gēri Achicha ahu, nu kwa nime Iko ahu. N'ihi na dika urù di ya si di uku, ma ọ buru na ayi ewere ezi obi ncheghari na okwukwe di ndu we nara Sacrament nsọ ahu; (n'ihi na mbe ahu ayi nēri anu-aru nke Kraist, nānu ọbara-Ya, nime mọ di nime ayi; mbe ahu ayi ebiri nime Kraist, Kraist ebiri kwa nime ayi; ayi na Kraist aburu otù, Kraist na ayi aburu otù.) ọ bu otú a ka ihe-ize-ndu di ya di uku, ma ọ buru na ayi anara ya nēkwesigh ekwesi. N'ihi na mbe ahu ikpe nke Aru na Ọbara Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, gāma ayi; ayi nēri nanu kwa ikpe nye onwe-ayi, ma ọ buru na ayi atulegh Aru nke Onye-nwe-ayi n'obi-ayi; ayi afunwue ọku iwe nke Chineke megide onwe-ayi; ayi akpasue iwe nke Ya ka Ọ were ọria di iche iche, na ọnwu di iche iche we nye ayi ahuhu. Ya mere, kpenu onwe-unu, umu-nnam, ka Onye-nwe-ayi ghara ikpe unu; chegharianu uche n'ezie bayere nmehie-unu gara aga; jidenu okwukwe di ndu nke guzosiri ike nime Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi; dozienu ibi-obi-unu, huzuenu madu nile n'anya, unu gēsi otú a buru ndi kwesiri iketa n'ihe-omimi nso ndia. Nke kasi ihe nile unu aghagh iwere ekele nke ezi obi di ume-ala na nke si n'obi-unu puta, kele Chineke, bú Nna, na Ọkpara, na Mọ Nsọ, n'ihi nbaputa nke uwa site n'ọnwu na ihu-ahuhu nke Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, Onye bu Chineke na madu n'otu: Onye wedara Onwe-ya we rue n'ọnwu n'elu Obe, n'ihi ayi, ndi-nmehie di emere ebere, ayi ndi dina n'ọchichiri na onyinyo onwu; ka Ọ we do ayi umu nke Chineke, ka Ọ we buli kwa ayi na ndu ebigh-ebi. Ma ka ayi we necheta mbe dum oké ihu-n'anya uku nke Onye-nwe-ayi, Jisus Kraist, bú nání otù Onye-nzọputa-ayi, n'isi otú a nwuru ayi ọnwu, na urù anāpugh iguta ọnu nke Ọ natara nye ayi site n'iwusi ọbara-Ya di oké ọnu; Ọ kawo, do kwa ihe-omimi di nsọ, ka ha buru ihe-ibe nke ihu-n'anya-Ya, na ihe iji cheta ọnwu-Ya mbe nile, n'ihi oke nkasi-obi-ayi ebigh-ebi, Ya mere ka ayi kele Ya na Nna na Mọ Nsọ ekele nēkelegide, [otú ọ bu ọlu-ayi nke-uku); ka ayi rubesia isi onwe-ayi rue ọchichọ-Ya di nsọ na ihe nile nātọ Ya utọ, ka ayi jisie ike fè Ya òfùfè n'ezi idi-nsọ na ezi omume ubọchi nile nke ndu-ayi. Amen.

Emesia, Presbyter gāgwa ndi nke biara gānara Oriri Nsọ,

Unu ndi cheghariri ezie n'obi-unu nile n'ihi nmehie-unu, unu ndi bi n'ihu-n'anya na obi-ọma unu na madu-ibe-unu nile, unu ndi zubere iso ndu ọhu, nējeso iwu nile nke Chineke, nējeghari kwa n'uzọ nsọ Ya nile site n'ubu a we gaba; Werenu okwukwe biarue nso, nara Sacrament nsọ nka bayere nkasi-obi-unu: werenu obi di ume-ala kwuputa nmehie-unu n'iru Chineke Nke puru ime ihe nile, buenu ikpere n'ala n'obi nwayọ.

Agusia, otù nime Ndi-minister gāgu Nkwuputa-nmehie nka nke ọra madu, n'aha ndi nile ọ di n'uche inara Oriri Nsọ; Minister ahu na madu nile gēbu ikpere n'ala n'obi di ume-ala, nāsi,
 

Exhortations

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye kere ihe nile, Onye nēkpe madu nile ikpe; Ayi kwere nākwa kwa ọtutu nmehie-ayi na njọ-ayi, Nke ayi meworo mbe na mbe n'ajọ isi ike, Nime èchìchè, na okwu, na omume, Megide Ebube-Gi, bú Chineke, Nākpasu iwe na ọnuma Gi megide onwe-ayi ka o si kwesi ezie. Ayi ewere obi-ayi nile chegharia, Ebere eme ayi n'ala obi-ayi n'ihi nmehie-ayi ndia; Ncheta ayi nēcheta ha nēwuta ayi; Ibu-arọ-ha ekwegh ayi gēbu. Mere ayi ebere, Nna Nke kasi ebere, mere ayi ebere; N'ihi Ọkpara-Gi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Baghara ayi ihe nile nke gara aga; Kwe ka site n'ubu a ka ayi nēfè Gi òfùfè, nēme ihe nātọ Gi utọ mbe nile, Na ndu ọhu, ka nsọpuru na otuto we diri Aha-Gi; Site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Agusia, Presbyter (ma-ọbu Bishop, ọ buru na ọ nọ) gēguzo ọtọ, che madu nile iru, ọ gāgu Ntọpu-nmehie nka.

Ka Chineke Nke puru ime ihe nile, Nna-ayi nke elu-igwe, Onwe sitere n'ebere uku Ya we kwe nkwa ibaghara nmehie ndi nile ji ncheghari nke si n'obi-ha puta na ezi okwukwe we che Ya iru; Ka Ọ mere unu ebere; ka Ọ baghara unu, ka Ọ zọputa unu n'aka nmehie-unu nile; ka Ọ nye unu ike, kà Ọ ba kwa unu ume n'ezi ihe nile; ka Ọ weta unu na ndu ebigh-ebi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Agusia, Presbyter gāsi,
 

Confession & absolution

Nurunu okwu nkasi-obi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist gwara ndi nile chere Ya iru ezie.

Biakutenum, unu nile ndi nādọbu onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.   Matiu II. 28.

Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila u'iyi, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi.   Jọn 3.16.

Nuru-kwa-nu okwu Saint Pọl kwuru.

Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izoputa ndi-nmehie.   I Timọti I. 15.

Nuru-kwa-nu okwu Saint Jọn kwuru.

Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nākwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume. Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi.   I Jọn 2. 1,2.

Emesia, Presbyter gāguba, ai,

Bulitenu obi-unu.
Ọziza. Ayi ebulite ha, nye Onye-nwe-ayi.
Presbyter. Ka ayi kele Onye-nwe-ayi Chineke ekele.
Ọziza, Ọ kwesiri, ọ ziri ezi ka ayi me otú a.

Emesia, Presbyter geche iru na Table nke Onye-nwe-ayi, ọ gāsi,

* Okwu ndia [Nna di Nsọ] agagu-gha ha na Sunday nke Trinity.

Ọ kwesi ka, o ziri ezi, ọ bu kwa ọlu-ayi ezie, ka ayi nēkele Gi ekele mbe nile n'ebe nile, Onye-nwe-avi *Nna di Nsọ Nke puru ime ihe nile, Chineke Onye di ndu ebigh-ebi,

N'ebe a Okwu-nmalite nke agāgu nani n'ubọchi nke ha gēso, ma ọ buru na Okuru-nmalite di akara àkà ka agua ya n'oge ahu: ọ buru na ọ digh nka gēso ngwa ngwa.

Ya mere ayi nēto, nēbuli kwa Aha otuto Gi, ayi na Ndi-mọ-ozi na Ndi-isi-mọ-ozi na usu nile nke elu-igwe; nēto Gi mbe nile, nāsi, Nsọ, Nsọ, Nsọ, Jehova Chineke nke usu nile nke ndi-agha, elu-igwe na uwa juputara n'otuto-Gi: Otuto diri Gi, Jehova Nke kachasi ihe nile elu. Amen.
 

Comfortable words

OKWU-NMALITE NKE AGĀGU NANÍN'UB ỌCHI-HA.

N'ubọchi Christmas, na ubọchi asa so ya.

N'ihi na I were Jisus Kraist nání otù Ọkpara-Gi nye ka amua Ya n'ihi ayi na mbe dika nka: Onye ewere am nne-Ya Nwa-abọghọ nāmagh nwoke, bú Meri, we me Ya madu ezie, site n'ọlu nke Mọ Nsọ; Madu Nke nēnwegh ntupọ nmehie, ka Ọ we sachapu ayi nmehie nile. Ya mere ayi nēto, etc.

N'ubọchi Easter, na ubọchi asa so ya.

Ma nke kasi, ọ bu olu-ayi ito Gi n'ihi Nbilite-n'ọnwu di otuto nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi: n'ihi na Ya onwe-ya bu Nwa-aturu Oriri Ngabiga ezie, Nke eji chu aja n'ihi ayi, Onye bupuworo nmehie nke uwa; Onye buworo ọnwu site n'ọnwu nke Ya, O site kwa na nbilite-n'ọnwu nke O siri n'ọnwu ba na ndu ọzọ weghachiworo ayi ndu ebigh-ebi, Ya mere ayi nēto, etc.

N'ubọchi Nrigo-n'elu-igwe, na ubọchi asa so ya.

Site n'Ọkpara-Gi Nke I hubigara rr'anya ókè, Jisus Kraist, bu Onye-nwe-ayi; Onye gosiri Ndi-ozi-Ya nile Onwe-ya n'ihè nke-ọma mbe Nbilite-n'ọnwu-Ya kasi otuto gabigasiri, Ọ rigo-kwa-ra n'elu-igwe n'anya-ha, idoziri ayi ọnọdu: ka ebe Ọ nọ, ka ayi we rigo kwa n'ebe ahu, ka ayi na Ya we buru eze n'otuto. Ya mere ayi nēto, etc.

Na Whit-sunday, na ubọchi isi so ya.

Site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi: Onye ọ bu dika nkwa-Ya bukarisiri ezie si di ka Mọ Nsọ were oké ùzù mberede si n'elu-igwe ridata dika na mbe a, dika ọ bu oké ifufe, nihe yiri ire ọku, nọkwasi n'isi Ndi-ozi, izí ha ihe, na idubà ha n'ezi-okwu nile; nēnye ha onyinye nke asusu di iche iche, na anya-ike kwa ka ha were inu-ọku nke-uku n'obi we nēkwusara mba nile Ozi Ọma mbe nile; nke eji weputa ayi n'ọchichiri na njehie bà n'ihè nēnwu nke-oma na ezi ọmuma nke Gi, na nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist. Ya mere ayi nēto, etc.

Nání n'Ememe Trinity.

Onye bu otù Chineke, otu Onye-nwe-ayi: ọ bugh nání otù Onye, kama Ndi di atọ nime otù Udi. N'ihi na ihe ayi kwere bayere otuto nke Nna, otù ihe ahu ka ayi kwere bayere Ọkpara, na bayere Mọ Nsọ, ha enwegh idi-iche ọ bula ma-ọbu aratagh-arata. Ya mere ayi nēto, etc.

Agusia Okwu-nmalite ọ bula nime ndia, agābù ma-ọbu gua ngwa ngwa, ei,

Ya mere ayi nēto, nēbuli kwa Aha otuto Gi, ayi na Ndi-mọ-ozi na Ndi-isi-mọ-ozi na usu nile nke elu-igwe; nēto Gi mbe nile, nāsi, Nsọ, Nsọ, Nsọ, Jehova Chineke nke usu nile nke ndi-agha, elu-igwe na uwa juputara n'otuto-Gi: Otuto diri Gi, Jehova Nke kachasi ihe nile elu. Amen.

Emesia, Presbyter gēbu ikpere n'ala na nso Table nke Onye-nwe-ayi, ọ gēkpe Ekpere nko so n'aha ndi nile gānara Oriri Nsọ.
 

Proper Prefaces

Ayi azọbayegh ukwu ibia na Table nke Gi, Onye-nwe-ayi Onye-ebere, dika ayi tukwasiri obi n'ezi omume onwe-ayi, kama ayi tukwasiri obi n'ọturu ebere uku Gi. Ayi ekwesigh itutukọ irighiri nri nokpuru Table-Gi. Ma Gi bu Otù Onye-nwe-ayi ahu, Onye nwe ime ebere mbe nile: Ya mere Onye-nwe-ayi Onye-arnara, kwe ka ayi si otú a rie anu-aru nke Jisus Kraist, bú Okpara-Gi I huru n'anya, ka ayi si kwa otú a nua ọbara-Ya, ka ewe do aru nmehie ayi ọcha site n'aru-Ya, ka ewe sacha kwa nkpuru-obi-ayi site n'ọbara-Ya nke kachasi oké ọnu, ka ayi we biri nime Ya, ka Ya onwe-ya we biri kwa nime ayi mbe nile. Amen.

Mbe Presbyter, ka o guzo ọtọ n'iru Table, o dozisia Achicha na Manya-vine otú ọ gādiri ya nfe inyawa Achicha nke-oma n'iru ọra madu, na iwere kwa Iko n'aka-ya, ọ gēkpe Ekpere nke Ido-nsọ, otú a.
 

Prayer of Humble Access

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nna-ayi nke elu-igwe, Onye sitere n'ebere obi nro nke Gi we nye Jisus Kraist, bú nání otù Ọkpara-Gi, ka Ọ nwua ọnwu n'elu abe n'ihi nbaputa nke ayi; Onye sitere n'ifè-òfùfè Ọ were Onwe-ya fè nání otú mbe we chua n'ebe ahu otù àjà zuru ezu, nke zu-kwa-ra ókè, bo kwa nkpà, bú ifè-òfùfè na ihe juru afọ n'ihi nmehie nke uwa nile, Ọ ka-kwa-ra, nye kwa ayi iwu nime Ozi Ọma Ya di nsọ, ka ayi nēchetagide ọnwu-Ya di oké ọnu mbe nile, rue mbe Ọ gābia ọzọ; Nuru olu-ayi, Nna nke ebere, ayi nāriọ Gi n'obi dikariri ume-ala; kwe, ka ebe ayi nara achicha na manya-vine ndia, bú ihe I kère, otú ihe Ọkpara-Gi Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, kara di nsọ, ka ewe nēcheta ọnwu-Ya na ihu-ahuhu-Ya, ka ayi we buru ndi-nketa nke Aru na Ọbara-Ya dikarisiri ngọzi: Onye

(a) N'ebe Presbyter geburu Ahere n'aka-ya;
(b) N'ebe a ọ ga-nyawa Achi-cha:
(c) N'ebe a o gebi kwasi Achicha nile aka-ya:
(d) N'ebe a o geburu Iko n'aka ya;
(e) N'ebe a o gebikwasi ihe obula aka (ma-ọbu Chalice ma-ọbu Flagon) nke Manya-vine agedo osọ di nime ya;

(a)nara Achicha n'otú abali ahu nke arara Ya nye n'aka ndi-iro-Ya; mbe Ọ kelesiri ekele, (b)Ọ nyawa ya, Ọ nye ndi nēso uzọ Ya si Naranu ri kwa (c)nka bu Arum nke anēnye n'ihi unu: Nēmenu nka ka unu we nēchetam. Mge ha risiri nri anyasi Ọ (d)nara kwa Iko otú ahu; mbe Ọ kelesiri ekele, Ọ nye ha, si, Unu nile nua nime nka; n'ihi na (e)nka bu Ọbaram nke Obuba-ndu Ọhu nke anāwusi n'ihi unu na n'ihi ọtutu madu, n'ihi nbagara nmehie: Nēmenu nka, mbe ọ bula unu gānu ya ka unu we nēchetam. Amen.

Agusia, Minister ya onwe-ya gāburu uzọ nara Oriri Nsọ n'uzọ abua ahu, emesi kwa ọ nyebe Ndi-bishop na Ndi-presbyter na Ndi-deacon otú ahu, (ma ọ buru na onye ọ bula di otú a nọ,) enyesia, ọ gēnye kwa ọra madu n'usoro n'aka-ha, ha nile gēbu ikpere n'ala nwayọ. Mbe ọ nyere onye ọ bula Achicha ọ gāsi,
 

Prayer of Consecration

Aru nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke enyere n'ihi gi, ka ọ chebe aru na nkpuru-obi-gi rue na ndu ebigh-ebi. Nara nka rie, nēcheta na Kraist nwuru n'ihi gi, were Ya me nri n'obi-gi site n'okwukwe, ya na ikele-ekele.

Minister nke nyere onye ọ bula Iko gāsi kwa,

Ọbara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke awusiri n'ihi gi, ka ọ chebe aru na nkpuru-obi-gi rue na ndu ebigh-ebi. Nua nka, nēcheta na awusiri Ọbara Kraist n'ihi gi, jide ekele.

Ọ buru na Achicha ma-ọbu Manya-vine nke edoro nsọ agwusia tutu ha nile eketasia, Presbyter gēdo ọzọ nsọ, dika Uzọ eburu uzọ ka si di; ọ gāmalite igu na [Kraist Onye-nzọputa-ayi nara Achicha n'otù abali ahu, etc.] n'igọzi Achicha: ọ gāmalite igu na [Mbe ha risiri Nri Anyasi Ọ nara kwa, etc.] n'igọzi Iko.

Mbe ha nile ketasiri, Minister gēchighari na Table nke Onye-nwe-ayi, ọ gēwere nsọpuru tukwasi n'elu ya ihe nke fọduru nime Nri edoro nsọ, were ezi ákwà ocha bakwasi ya.

Emesia, Presbpter gēkpe Ekpere nke Onye-nwe-ayi, pra madu ganāzaso ya n'Aririọ ọ bula.
 

Words of administration

Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka Aha-Gi di nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi tao Baghara ayi ihe ọjọ nile ayi mere, Otú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ. Edebula ayi nime ọnwunwa: Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe: N'ihi na ala-eze bu nke Gi, Na ike, na otuto, Mbe nile mbe nile. Amen.

Emesia, agāgu otú a.
 

Lord's Prayer

Onye-nwe-ayi, Nna nke elu-igwe, ayi ndi-orù-Gi di ume-ala n'obi ji obi-ayi nile nāriọ obi-ọma-Gi dika Nna, ka I were ebere nara àjà nka, bú otuto na ekele a yi ji kele Gi; a yi ji ezi obi di ume-ala nāriọ Gi ka I kwe, ka site n'olu oma na ọnwu nke Okpara-Gi Jisus Kraist, na site n'okwukwe n'ọbara-Ya, ka ayi na Nzukọ-Gi nile we nata nbaghara nmehie-ayi nile, na urù ọzọ nile nke putara nime ihu-ahuhu-Ya. N'ebe a, Onye-nwe-ayi, ayi eche onwe-ayi n'iru Gi, bú nkpuru-obi-ayi na aru-ayi, ka ayi we buru àjà di ndu achuru Gi, nke bu ihe kwesiri ekwesi di kwa nsọ: ayi nāriọ Gi n'obi di ume-ala, ka ayi nile, bú ndi-nketa n'Oriri nsọ nka, ka ayi juputa n'amara nke Gi na ngọzi nke elu-igwe. Ọ bu ezie na ayi ekwesigh ichuru Gi aja ọ bula, n'ihi ọtutu nmehie-ayi, ma ayi nāriọ Gi ka I nara ọlu-ayi nka na ifè-òfùfè nka nke ayi nāgagh ilu na ifè; agula ihe kwesiri omume-ayi, kama baghara ayi nmehie-ayi, site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi; Onye nsọpuru na otuto nile diri Gi site na Ya na yere Ya n'idi-n'otù nke Mọ Nsọ, Nna Nke puru ime ihe nile, rue uwa ebigh-ebi. Amen.

Ma-ọbu nka.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye di ndu ebigh-ebi, ayi ewere obi-ayi nile nēkele Gi, n'ihi na I wedatara Onwe-gi gēwere nri nke Mọ nke Aru na Obara kasi oké ọnu nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, we zùa ayi, bú ndi nara ihe-omimi nsọ ndia ka o si kwesi; I we me ka ayi mara iru-ọma-Gi na obi-ọma-Gi u'ebe ayi nọ; na ayi bu kwa ihe di n'aru ezie anyagidere n'Aru di omimi nke Ọkpara-Gi, nke bu òtù di ngọzi nke ndi nile kwere na Ya; na ayi bu kwa ndi-nketa ala-eze ebigh-ebi nke Gi site n'olile-anya, n'ihi ọlu oma nke ọnwu na ihu-ahuhu kasi oké onu nke Ọkpara-Gi I huru n'anya. Ayi ewere ezi obi di ume-ala nāriọ Gi, Nna nke elu-igwe, ka I si otú a were amara-Gi yere ayi aka, ka ayi we bigide nime nnwekọ ahu nke di nsọ, we nālu otú ezi ọlu nile nke I kwadebeworo ayi ka ayi nākpaghari nime ha; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Onye nsọpuru na otuto nile diri, yere Gi na Mọ Nsọ, we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.

Emesia agāgu ma-ọbu bua,
 

Prayer of thanksgiving

Otuto diri Chineke n'elu, udo di kwa n'uwa, obi-oma n'ebe madu nọ, Ayi nēto Gi, ayi nāgọzi Gi, ayi nāsọpuru Gi, ayi nēnye Gi otuto, ayi nēkele Gi ekele n'ihi otuto uku Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Eze nke elu-igwe, Chineke, bú Nna Nke puru ime ihe nile.
    Onye-nwe-ayi, Jisus Kraist, bú Ọkpara amuru nání Gi; Onye-nwe-ayi Chineke, Nwa-aturu Chineke, Ọkpara nke Nna, Onye nēbupu nmehie nke uwa, mere ayi ebere. Gi Onye nēbupu nmehie nke uwa, mere ayi ebere. Gi Onye nēbupu nmehie nke uwa, nara ekpere-ayi. Gi Onye nānọdu ala n'aka-nri Chineke, bú Nna, mere ayi ebere.
    N'ihi na nání Gi di nsọ; nání Gi bu Onye-nwe-ayi; nání Gi, Kraist, yere Mọ Nsọ, bu Onye Kachasi elu n'otuto nke Chineke, bú Nna. Amen.

Emeaia, Presbyter (ma-ọbu Bishop, ọ buru na ọ nọ) gēwere ngọzi nka zilaga ha.

Ka udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, chebe obi-unu na èchìchè-uchè-unu n'ọmuma na ihu-n'anya nke Chineke, na nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi: ka ngọzi nke Chineke Nke puru irne ihe nile, bú Nna na Ọkpara na Mọ Nsọ, di n'etiti unu, diye-kwa-ra unu mbe nile. Amen.
 

Gloria & final blessing

Collect nice agāgu ma Onyinye gabigaaia, mbe Oriri Nsọ nāgagh-adi, ubọchi ọ bula di ot'u a agāgu otù ma-ọbu ike kariri otù, nime ha; agāgu k:wa otù, ike ahu, mpe ọ bula achọrọ, ma agusia Collect, ma-ọbu nke Ekrpere Ututu ma-ọbu nke Ekpere Anyasi, ma-ọbu nke Oriri Nsọ, ma-ọbu nke Litany, otú ọ di nma n'anya Minister.

Onye-nwe-ayi, were ebere yere ayi aka n'aririọ na ekpere ayi ndia, dozi kwa uzọ ndi-orù-Gi we rue n'inata nzọputa ebigh-ebi; ka n'etiti nbanwe nile na ihe nile nēme na ndu ọnwu nka, ka iye-aka-Gi nke amara dikarisiri na nke jikere ejikere we nāluru ha ọgù. mbe nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Onye-nwe-ayi Nke puru ime ihe nile, Chineke Nke di ndu ebigh-ebi, ayi nāriọ Gi ka I wedata Onwe-gi iduzi na ido nsọ na ichi, rna obi-ayi ma aru-ayi, n'uzọ iwu-Gi nile, na n'ọlu nke ihe nile I nyere n'iwu: ka site na nchegide-Gi nke kachasi ihe nile ike, ma n'ebe a ma na mbe nile, ka ewe chebe ayi n'aru na nkpuru-obi; site n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi. Amen.

Chineke Nke purn ime ihe nile, ayi nāriọ Gi, ka I kwe ka okwu nke ayi nuworo ta na nti-ayi putara ìhè, ka ewe si otú a nyakudo ha nirne obi-ayi site n'amara-Gi, ka ha we mia nkpuru nke ibi ezi obi nime ayi, ka nsọpuru na otuto we diri Aha-Gi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Onye-nwe-ayi, were amara iru-ọma-Gi nke kachasi ihe nile buru uzọ ga n'iru ayi n'ornume-ayi nile, were kwa iye-aka-Gi nke nādigide mbe nile nēdu ayi n'uzọ; ka ayi we nye Aha-Gi di nsọ otuto nime olu-ayi nile, nke ayi malitere, nālugide, we lubie na Gi, ka ayi we nata kwa ndu ebigh-ebi n'ikpe-azu site n'ebere-Gi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Chineke Nke puru irne ihe nile, isi-iyi nke amam-ihe nile, Onye mara nkpà nke ayi tutu ayi ariọ, na amagh-ihe-ayi n'iriọ aririọ; Ayi nario Gi ka I mere adigh-ike-ayi ebere; ma ihe nile ayi nēnwegh iru iriọ n'ihi ekwesigh-ekwesi-ayi, nke ayi nọpugh kwa iriọ n'ihi ikpu-ìsì-ayi, Gi wedata kwa Onwe-gi nye ayi ha n'ihi ikwesi-ekwesi nke Ọkpara-Gi, Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Chineke Nke puru irne ihe nile, Onye kweworo nkwa inu aririọ nke ndi nāriọ n'Aha Ọkpara-Gi; Ayi nāriọ Gi ka I were ebere do nti-Gi n'ebe ayi nọ, bú ndi butara Gi ekpere-ayi na aririọ-ayi ubu a; kwe ka ayi natazue ihe nile ayi ji okwukwe we riọ dika I si achọ, n'ibo nkpà-ayi, na igosi otuto-Gi n'iru ọra madu; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Na Sunday na Ubọchi Nsọ ọzọ (ọ buru na Oriri Nsọ adigh) agāgu ike nile akara àkà n'Oriri Nsọ, we rue n'ikpe-azu Ekpere n'ihi ọro madu [N'ihi ọnọdu nile nke Nzukọ Kraist nālu ọgù n'uwa nka] tiyere otù, ma-ọbu nke kariri otù, nime Collect ndia edere n'elu ebe a, ka agēwere Ngọzi gubie.

Iri Nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi agagh-adi, ma ọnu-ọgugu ndi biara erugh isoro Presbyter kekọ, dika o si di ya nma n'ucke.

Ọ buru na ha akagh orú madu n'Ebe ahu ndi tozuru etozu inara Oriri Nsọ; Oriri Nsọ ọ bula agagh-adi, ma madu anọ (ma-ọbu madu atọ otú ọ di) esogh Presbyter ketakọ,

N'ulo Chineke nke Cathedral na nke Oollege na nime College, ebe ọtutu Presbyter na Deacon di, ha nile gānara Oriri Nsọ, ha na Presbyter, kwa-Sunday otú ọ di, ma ha enwegh ezi ihe gēbochi ha.

Ka ewe wepu ike nile gākpata esem-okwu na èchìchè nēzigh ezi, nke onye ọ bula nwere, ma-ọbu nke onye ọ bula puru inwe layere Achicha na Manya-vine ahu, ọ gādi nma ka Achicha ahu buru otú anēri eri; ma ọ gābu Achicha nke utu-ọka wheat kasi nma nke ha nwere ike ichọta.

Ọ buru na Achicha na Manya-vine fọduru anēdogh nsọ, Curate gēwere ya n'onwe-ya: ma ọ buru na ọ fọdu. nime nke edoro nsọ, agagh-ewere ya pua n'Ulo Chineke, kama Presbyter na otú ndi ọzọ nime Ndi-nketa nke ọ gākpọ biakute ya mpe ahu, ha gēwere nsọpuru ua nya n'oge ahu enyesiri Ngọzi.

Curate na Ndi-church-warden gēwere ego nke Nzukọ Kraist di n'ebe ahu zuta Achieha na Manya-vine nke Oriri Nsọ.

Riba kwa ama, na Onye Nzukọ Kraist ọ bula nke ebe ọ bula gēketa nime Oriri Nsọ mbe atọ n'arọ otú ọ di, otù nime ha gābu Easter. Kuia-arọ na mbe Easter Onye N'zukọ Kraist ọ bula nke ebe ọ bula na Parson, ma-ọbu Vicar, ma-ọbu Curate, ma-ọbu ndi ha gēzi, gāpiazi; ha gāturu ha utu Ulo Chineke nile, ka esi atu, nke agākwu ugwọ ya mpe ahu n'ebe ahu.

Nzukọ Ikpere Chineke lasasia, ego enyere n'Onyinye, agēkè ya nye n'ime amara ihu-n'anya, otú Minister na Ndi-church-warden gēzu n'uche-ha. Ọ buru na ha ekweritagh n'ime nka, agēkè ya otú Bishop kara àkà.

Ebe akara n'Usoro nke Inye Nri-anyasi nke Onye-nwe-ayi nka, na Ndi-nketa gēbu ikpere n'ala we nara ya; (iwu nka ezubere yo na nma ka ewe gosi ekele obi di ume-ala nke ayi n'ihi urù nke Kraist enyeworo Ndi-nketa nile kwesiri ekwesi nime ya, ka ewe ze kwa nmetọ na aghara nime Oriri Nsọ ahu, nke gāputa ma ọ buru na emegh otú a;) ka onye ọ bula ghara ighọtahie ibu-ikpero nka, ma-ọbu metọ ya, site n'amagh-ihe na adigh-ike nke ya, ma-ọbu site n'idebe iwe na isi ike; Ya mere ekwuputara nka, si, Na ezubegh nsọpuru ọ bula n'ibu-ikpere ahu, ma ọ kwesigh ka asọpuru Achicha ma-ọbu Manya-vine nke Sacrament, nke anara n'ebe ahu n'aka nke aru, ma-ọbu isọpuru Nnọdu ọ bula nke Anu-aru na Ọbara nke Aru Kraist eji muputa Ya. N'ihi na Achicha na Manya-vine nke Sacrament di ka esi kè ha, n'ihi yo, agagh-asọpuru ha; (n'ihi na nke ahu gābu ikpere arusi, nke ndi nile ndi kwere na Kraist gākpọ asl;) Aru na Ọbara nke Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, eji muputa Ya di n'Elu-igwe, ha adigh n'ebe a; n'ihi na ọ megidere ezi-okwu nke Aru Kraist eji muputa Ya na Ọ gānọ kari n'otù ebe otù mbe ahu.

Collects


Return home

Web author: Charles Wohlers U. S. EnglandScotlandIrelandWalesCanadaWorld