H
flag of Nigeria The Book of Common Prayer
United States England Scotland Ireland Wales Canada World

 
    Ekpere Na Abu
The Book of Common Prayer in Igbo

 

USORO NKE

EKPERE ANYASI,

KWA-UBỌCHI N'ARỌ


Na nmalite Ekpere Anyasi Minister gewere olu ike gua otù, ma-ọbu kari otù, nime Ama-okwu ndia si n'Akwukwọ Nsọ puta nke so. Agusia, ọ gāgu ike edeuioro n'akwukwọ n'okpuru Ama-okwu ndia.

Mbe onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya nke ọ meworo chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu.    Ezikiel 18. 27.

N'ihi na mu onwem mara njehiem nile, nmehiem di kwa n'irum mbe nile.    Abu Oma 51. 3.

Zopu iru-Gi na nmehiem nile, hichapu kwa ajọ omumem nile.    Abu Oma 51. 9.

Àjà nile nke Chin eke bu mo tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I digh-eleda ya anya.    Abu Oma 51. 17.

Dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute JehoYa, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi-ebere ka Ọ bu, Onye nādigh-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.    Joel 2.13.

Onye-nwe-ayi Chineke-ayi ka obi-ebere nile na nbaghara nile diri; n'ihi na ayi anupuwo isi n'okpuru Ya; ayi egegh kwa olu JehoYa, bú Chineke-ayi, nti, ijeghari n'iwu-Ya nile, nke 0 tiyere n'iru ayi.    Daniel 9. 9, 10,

Dọm aka na nti, JehoYa, ma náni n'ikpe; adọlam aka na nti n'iwe-Gi, ka I we ghara ibilatam. Jeremaia 10. 24.    Abu Oma 6. 1.

Chegharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.    Matiu 3. 2.

M'gebili jekuru nnam, m'gasi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe na n'iru gi: ekwesighm ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.    Luk 15. 18, 19.

Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpe; nihi na ọ digh onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.    Abu Oma 143. 2.

Ọ buru na ayi asi na ayi enwegh nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adigh kwa nime ayi. Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka Ọ we baghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.    1 Jọn 1. 8, 9.

Umu-nnam m'huru n'anya nke-uku, Akwukwọ Nsọ nēzi ayi n'ebe di iche iche ka ayi kwere ọtutu nmehie-ayi na ajọ omume-ayi, ka ayi kwuputa ha; ka ayi ghara izobe ma-ọbu kpuchie ha n'iru Chineke, bú Nna-ayi nke elu-igwe, Nke puru ime ihe nile; kama ka ayi kwuputa ha n'obi di ume-ala, nke nwayọ, nke ncheghari, na nke inu-okwu, ka ayi we nata nbaghara nmehie-ayi site n'obi-ọma-Ya na ebere-Ya nādigh-agwu agwu. Ọ bu ezie na ọ kwesiri ka ayi nēkwere nmehie-ayi n'iru Chin eke n'obi di ume-ala mbe nile: ma ọ kwesiri ka ayi nēme kari otú ahu mbe ayi nọkọrọ zukọ kwa n'otù ka ayi kele Ya ekele n'ihi oke ihe ọma nile nke ayi natara n'aka-Ya; ka ayi gosi otuto nke kwesiri Ya n'ezie n'iru ora madu; ka ayi nuru Okwu-Ya nke kasi di nsọ; ka ayi riọ ihe nile nke kwesiri ayi, nākpa ayi, ma n'aru ma na nkpuru-obi nke ayi. Ọ bu n'ihi nka ka m'nēkpere unu, nāriọ unu, ka unu ra nọ n'ebe a, ka unu sorom ri'obi ọcha na olu di ume-ala, we je n'oche-eze amara nke elu-igwe, nāzasom;

Nkwuputa-nmehie nke ọra madu, nke ndi nile nọ na nzukọ ahu ganāzaso Minister, ya na ha ebue ikpere n'ala,
 

Evening Prayer
Nna-ayi nke puru ime ihe nile, Onye kasi ebere; Ayi ejehiewo, kpafu kwa n'uzọ-Gi ka aturu furu efu. Ayi sokariri izuzu na ọchichọ nke obi-ayi. Ayi emebiwo iwu-Gi di nsọ. Ayi arapuwo ime ihe kwesiri ka ayi me; Ayi emewo kwa ihe nēkwesigh ka ayi me; Ezi ndu adigh nime ayi. Ma Gi, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, ayi ndi ọjọ nke di imere ebere. Chineke, rapu ndi kwuputara ihe ọjọ ha mere. Weghachi ndi nēcheghari uche-ha; Dika nkwa-Gi nke I kwere madu nile nime Kraist Jisus, bú Onye-nwe-ayi, Kwe, Nna nke kasi ebere, n'ihi Ya; Ka ayi we si ubu a diba ndu iyi Chineke, na nke ezi omume, na ndu anya-udo, Ka otuto we diri Aha nsọ Gi. Amen.

Ntọpu, ma-ọbu Nbaghara nmehie, nke nání Presbyter gāgu, ka o neguzo ọtọ; ọra madu ebue ikrpere n'ala,
 

Confession

Chineke, Nke puru ime ihe nile, Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye nāchọgh ọnwu nke onye-nmehie, kama ka o si n'ajọ omume-ya puta, ka ọ we di ndu; Onye were ike na iwu nye Ndi-ozi-Ya, ka ha we kwuwa gu-kwa-ra ndi-Ya Ntọpu na Nbaghara nke nmehie-ha, ebe ha eheghariri: Ọ gābaghara tọpu kwa ndi nile cheghariri n'ezie, ndi nējigh aghughọ kwere Ozi Ọma Ya di nsọ. N'ihi nka ka ayi riọ Ya ka Ọ nye ayi ezi ncheghari na Mọ Nsọ Ya, ka ihe nile ayi nēme ubu a we to Ya utọ: ka ndu-ayi fọduru we si ubu a nādi ọcha na nsọ; n'ikpe-azu ka ayi we bia n'ọṅu ebigh-ebi nke Ya; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Ọra madu gāza n'ebe a na ngubi ekpere ọzọ nile, Amen.

Emesia, Minister gēbu ikpere n'ala, ọ gēwere olu agānu nke-ọma gua Ekpere nke Onye-nwe-ayi: ọra madu nile gēbu kwa ikpere n'ala nāzaso ya, ma n'ebe a, ma n'ebe ọ bula ọzọ eji ya kpere Chineke.
 

Absolution

Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka Aha-Gi di nsọ, Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. Baghara ayi ihe ọjọ nile ayi mere, Otú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ. Edubala ayi nime ọnwunwa; Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe: N'ihi na ala-eze bu nke Gi, Na ike, na otuto, Mbe nile mbe nile. Amen.

Agusia, ọ gāsi,

Onye-nwe-ayi, meghe ebubere-ọmu-ayi.
Ozisa. Ọnu-ayi gēkwuputa kwa otuto-Gi.
Presbyter. Chineke, zọputa ayi ọsọsọ,
Oziza. Onye-nwe-ayi, me ngwa iyere ayi aka.

Ubu a madu nile gēbili ọtọ, Presbyter gāsi,

    Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;
    Oziza. Otú ọ diri na mbu, ọ di Ubu a, ọ gādigide otú a: we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
    Presbyter. Tobenu Onye-nwe-ayi.
    Oziza. Ka eto Aha Onye-nwe-ayi.

Emesia, agāgu mo-ọbu bua Abù ọma n'u80ro dika esi ka ha. Emesia, agāgu Ihe-nmuta eweputara nime Testament Ochie dika eei ka ya. Agusia, agāgu ma-ọbu bua Magnificat (ma-ọbu Abù nke Nwa-abọghọ di ngọzi nāmagh nwoke, bú Meri,) ka o si so.

MAGNIFICAT. Luk 1. 46-55.

    Nkpuru-obim nēme ká Onye-nwe|-ayi di | uku: ọ nātọ kwa mọm utọ nke-uku na Chinéke, bu | Onye | -nzọpu |tam.
    N'ihi na Ọ lere ọnọ|du di | ala: nke | orù|-Ya nwa|yi.
    N'ihi na lé, si|te n'u|bu a: ọbọ nile gākpọm | onye
ngọzi di|ri.
    N'ihi na Onye di ike emewom ihe úku | di iche | iche: Ahá|-Ya — | di kwa | nsọ.
    Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nátu | egwu | Ya: rué | ọbọ | na ọ|bọ.
   Ọ werewo ogwe-áka-Ya | gosi i|ke: Ọ chusawo ndi-npako n'echì|chè nke | obi|-ha.
   Ọ wedawo ndi di ike pua n'ó|che-eze|-ha: weli kwa elu ndi ọnọ|du-ha | di a|la.
   Ọ werewo ezi ihe nile nyeju ndi águ nā|gu a|fọ: zipu kwa ndi-ọga|ranya | n'aka e|fu.
   Ọ yeworo Israel nwa-Ya aka ka, Ọ we chéta| ebe|re: dika Ọ gwara nna-ayi-hà, n'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ | rue mbe | ebigh-e|bi.
    Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: na | — — | Mọ — | Nsọ.
    Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gādígi|de o|tu a: we rue n'úwa | ebigh-e|bi. A|men.

Ma-ọbu Abù Ọma 98: ma agagh-abù ya n'ubọchi nke iri-na-iteghete n'ọnwa, bú ubọchi agāgu ya n' Abù Oma diri ubọchiahu;

Emesia, agāgu Ihe-nmuta eweputara nime Testament Ọhu dika esi ka ya. Agusia, agāgu ma-ọba bua Nunc dimittis (ma-ọbu. Abù nke Simeon), ka o si so.

NUNC DIMITTIS. Luk 2. 29-32.

    Onye-nwem, ubu a ka I nārapu orù-Gi ká ọ | la n'u|do: dika | okwu|-Gi si di.
    N'ihi na ànyam | ahu|wo ; nzọ| — — |puta|-Gi,
    Nké I | dozi|ri: n'í|ru ndi | ni—|le;
    Ìhè agēkpughere mba ní|le ọ|zọ: na ébu|be ndi|-Gi, bu | Israel.
    Otuto diri Nná, | na Ọkpa|ra: ná | — — | Mọ — | Nsọ,
    Otu ọ diri na mbu, ọ di ubu a, ọ gọdígi|de o|tu a: we rue n'úwa | ebigh-e|bi. A|men.

Ma-ọbu Abù ọma 67; ma agagh-abù ya n'ubọchi nke-iri-na-abua n'ọnwa.

Mbe ahu Minister na ọra madu gāgu ma-ọba bua Okwukwe nke Ndi-ozi, ha eguzo ọtọ.
 

Lord's Prayer

    Ekwem na Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile, Onye kere elu-igwe na uwa.
    Ekwem na Jisus Kraist nání otù Okpara-Ya, bú Onye-nwe-ayi, Onye aturu ime site n'ike Mọ Nsọ; Nwa-abọghọ nāmagh nwoke, bú Meri, muru Ya, Ọ huru ahuhu n'ubọchi Pọntiọs Pailet, Akpọgidere Ya n'obe, Ọ nwua, elie Ya, Ọ ridara n'ala-mọ; N'ubọchi nke-atọ O si-kwa-ra na ndi nwuru anwu bilie ọzọ, Ọ rigoro n'elu-igwe, Ọ nānọdu n'aka-nri Chineke, bú Nna, Nke puru ime ihe nile: N'ebe ahu ka O gēsi bia ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu.
    Ekwem na Mọ Nsọ; Na Nzukọ Katolik nke di nsọ; Na nmekọ nke Ndi Nsọ; Na Nbaghara nmehie; Na Nbilite-n'ọnwu nke aru, Na ndu ebigh-ebi. Amen.

Nke ahu ga, agāgu Ekpere ndia nke so; mada nile gēwere nsọpuru bue ikpere n'ala; Minister gēburu uzọ were olu ike ei,

Onye-nwe-ayi nọyere unu.
Ọziza. Ka Ọ noyere kwa mọ nke gi.

Minister. Ka ayi kpere Chineke.
Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere.
    Kraist, mere ayi ebere.
Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere.

Emesia, Minister na ndi Clerk na ọra madu gēwere olu ike gua Ekpere nke Onye-nwe-ayi.
 

Apostles' Creed

Nna-ayi, Nke bi n'elu-igwe, Ka Aha-Gi di nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe I nāchọ, dika (esi eme ya) n'elu-igwe, (ka eme kwa ya) otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. Baghara ayi ihe ọjọ nile ayi mere, Otú ayi onwe-ayi si baghara ndi mere ayi ihe ọjọ, Edubala ayi nime ọnwunwa: Ma dọputa ayi n'aka ajọ ihe. Amen.

Bmesio, Presbyter gēguzo ọtọ, si,

Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi.
Ọziza. Nye kwa ayi nzọputa-Gi,

    Presbyter. Jehova, zọputa Eze-nwayi-ayi.
    Ọziza. Were ebere nuru olu-ayi mbe ayi kpọkuru Gi.
    Presbyter. Were ezi omume yikwasi Ndi-ozi-Gi.
    Ọziza. Me kwa ka ndi I rọtara ṅuria ọṅu.
    Presbyter. Jehova, zọputa ndi nke Gi.
    Ọziza. Gọzi kwa ihe-nketa-Gi.
    Presbyter. Jehova, nye udo na mbe-ayi.
    Ọziza. N'ihi na ọ digh onye ọ bula ọzọ nāluru ayi ọgù, ma ọ bu nání Gi, Chineke.
    Presbyter. Chineke, me ka obi-ayi di ọcha nime ayi.
    Ọziza. Ewepu-kwa-la Mọ Nsọ Gi nime ayi.

Emesia, Collect atọ gēso: nke-mbu bu nke diri ubọchi: nke-abua bu n'ihi Udo; nke-atọ ka Ohineke we yere ayi aka megide Ihe-egwù, nile, ka ha si so: agagh-abanwe Collect ikpe-azu abuo ndia, ma agāgu ha kwa-ubọchi n'Ekpere Anyasi.
 

Lord's Prayer

Collect nke-abua n' Ekpere Anyasi.

Chineke, Onye Nke ọchichọ nsọ nile na ezi izu nile na ọlu ziri ezi nile nēsite u'aka-Gi; Nye ndi nējere Gi ozi udo ahu nke uwa nāpugh inye ha; ka obi-ayi we guzosie ike n'idebe ihe nile I nyere n'iwu, ayi onwe-ayi kwa, ebe I nēbopuru ayi egwu ndi-iro-ayi, ka ayi we nānọ ubọchi-ayi nile n'izu-ike na udo: site n'ọlu ọma nke Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi. Amen.
 

2nd Collect

Collect nke-atọ, ka Chineke we yere ayi aka megide Ihe-egwù nile,

Me ka ọchichiri-ayi ghọ ìhè, ayi nāriọ Gi, Onye-nwe-ayi, were ebere uku Gi bopuru ayi ihe-egwù na ihe-ize-ndu nile nke uchichi ta; n'ihi ihu-n'anya Ọkpara-Gi, I muru nání Ya, Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi. Amen.

Nime Ọuire na n'Ebe ha nābù abù, Abù gēso n'ebe a.
 

Third Collect, for Aid against all Perils

Ekpere n'ihi Eze-nwayi.

Jehova, Nna-ayi nke elu-igwe, Onye di elu di kwa ike, Eze nke ndi bu eze, Onye-nwe ndi nwe madu, Onye nání Gi nāchi ndi-isi, Onye si n'oche-eze-Gi nēle ndi nile bi n'uwa anya: ayi ji obi-ayi nile ariọ Gi ka I were iru-ọma-Gi lekwasi Eze-nwayi-ayi nwere obi-ọma, bu Elizabeth; si otú a nyejue ya amara nke Mọ Nsọ Gi, ka ọ we legide iru n'ihe I chọrọ mbe dum, nāgā kwa n'uzo-Gi. Were onyinye elu-igwe nye ya ri-nne; kwe ka ọ di ogologo ndu ri'aru-ike na ọdi-nma; nye ya ike imerisi ndi-iro-ya nile; n'ikpe-azu, mbe ndu nka gasiri, ọ we rue ri'ọṅu na obi-utọ ebigh-ebi, site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Ekpere n'ihi Governor-General, Governor, na Ndi Chief.

Chineke, Onye Nke puru ime ihe nile, Onye di ndu ebigh-ebi, Okwu nsọ Gi ziri ayi, na obi nke ndi eze di n'ọchichi na nchikọ nke Gi, na I nedozi ha neme kwa ka ha chigharia ka o si kasi nma n'anya amam-ihe Gi ka Chineke: Avi were obi di ume-ala nariọ Gi ka I si otu a dozie obi oru-Gi bu Governor-General, na nke Governor akuku Nigeria ayi bi nime ya, na nke Ndi Chief na Ndi Okenye, ka nime echiche-ha na okwu-ha na ọlu-ha nile, ka ha nachọ-gide nsọpuru na otuto nke Gi mgbe nile; ka ha jisi kwa ike ichebe ndi nke Gi I nyere ha n'aka, n'ọdi nma, na udo, na iyi-Chineke: Kwere nka, Nna nke ebere, n'ihi Ọkpara-Gi I huru n'anya, Jisus Kraist, bu Onye-nwe-ayi. Amen.

Ekpere n'ihi Prime Minister na ndi nile ọzọ nachi isi.

Chineke, Nke puru ime ihe nile, Nna ayi nke elu-igwe, Onye nani Gi nachi ala-eze nke madu, neme ka ihe nile di ka o si di uche ọma Gi nma; Ayi nariọ Gi ka I gọzie Onye isi Obobo ayi bu Prime Minister, na Premier nke akuku Nigeria ayi bi nime ya na Premier ndi ọzọ ga, na ndi Minister nke obodo ayi, na ndi nile naga nzukọ uku ebe aneme iwu nachi obodo ayi. Ka aka dike Gi nāchi ha; me kwa ka obi ha juputa n'ihu iwu Gi n'anya, na ezi omume na ihe nenye ndu. Ka ife Gi ofufe na idi uchu nime ya, na udo na idi n' otu, na ezi okwu na ikpe ziri ezi we di sie ike n'etiti ayi we rue na ndudugandu ayi nile; site na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, Amen.
 

Prayer for the Queen's Majesty

Ekpere n'ihi Clergy na ọra madu nọ n'aka-ha.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nání Gi nēme ihe-ebube di uku; Zite Mọ amara-Gi Nke nēnye ezi ndu ka Ọ biakwasi Ndi-bishop-ayi, na Ndi-ozízí nile, na Nzukọ madu nile etiyere n'aka-ha; ka ha we nēme ihe gātọ Gi ezi utọ, wukwasi ha igirigi ngọzi-Gi mbe nile. Kwere nka, Onye-nwe-ayi, n'ihi nsọpuru nke Ọnu-nēkwuru-ayi, bú Jisus Kraist, Onye-obubo nke ayi. Amen.
 

Prayer for Clergy & People
Collect ma-ọbu Ekpere n'ihi Ọnọdu di iche iche nke madu nọ n'uwa, nke agāgu na mbe anākagh igu Litany.

Chineke, Onye kere madu nile, na Onye chebere ndu, ayi nāriọ Gi ri'obi di ume-ala n'ihi aha di iche iche na ọnọdu di iche iche nile nke madu nọ n'uwa; ka ọ tọ Gi ime ka ha mara uzọ-Gi nile, na ime ka mba nile mara ezi nzọputa-Gi. Nke ka uku, ayi nēkpere Gi n'ihi ezi ọnọdu nke Nzuko Catholick nke Kraist; ka ezi Mọ nke Gi si otú a nēdu ya, nāchi ya, ka ndi nile kwuputara n'iru ọra madu, kpọ onwe-ha Ndi Kraist, ka ewe duba ha n'uzọ nke ezi-okwu, ka ha we jide okwukwe-ha n'idi-n'otù nke mọ, na n'ihe-njikọ nke bu udo, na n'ezi omume nke ibi-obi-ha. Nke ikpe-azu, ayi aranye n'aka obi-orna-Gi na Nna ndi nile nwere ka ha si nodu n'ahuhu ma-ọbu na nkpa, n'uche-ha, ma-ọbu n'aru-ha, ma-ọbu n'ọnọdu-ha:
*Nka ka agāgu mbe madu nacho Ekpere nke Nzukọ.
[*nke ka uku ndi nke anāchọrọ ekpere-ayi,] ka ọ tọ Gi utọ ka I kasie ha obi, yere ha aka, ka nkpa-ha si di iche iche, nēnye ha ntachi-obi nime ihe nēbu ha nbu, na ezi nputa n'ahuhu nile nke ha. Nka ka ayi nāriọ Gi n'ihi Jisus Kraist. Amen.
 

The following two prayers do not appear in the 1662 BCP. They may be similar to the Prayer for All Conditions of Men and the General Thanksgiving, found in the US 1892 and 1928 BCP's.
Ekele bayere ihe nile.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nna nke ebere nile, ayi ndi-orù-Gi nēkwesigh ekwesi, ayi ekele Gi ekele nke obi di ume-ala, nke si kwa n'obi-ayi puta, bayere ezi ihe nile na obi-ọma nile nke I mere ayi, na madu nile;
*Nka ka agāgu mbe madu ekpe-woro ekpere bayere ha nachọ ka ha kele ekele.
[*nke ka uku bu nke I mere ndi nāchọ ubu a ka ha to Gi kele kwa Gi ekele bayere ebere nke I wedatara Onwe-Gi mere ha nādigh anya,] Ayi nagọzi Gi n'ihi okìkè I kere ayi, na nchebe I chebere ayi, na ngọzi nile nke ndu nka; ma nke kasi ha nile, n'ihi ihu-n'anya-Gi nke anāpugh iru ọnu, nke I ji baputa uwa site n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; n'ihi uzọ di iche iche I si enye amara, na n'ihi olile-anya nke otuto. Ayi nāriọ kwa Gi, ka I me ka ayi si otú a mata ebere-Gi nile, ka obi-ayi we juputa n'ekele nābugh nke nrafu, ka ayi we nēgosi otuto-Gi n'iru ọra, ọ bugh náni n'ebubere-onu-ayi, ma n'ibi-obi-ayi kwa; site n'irara onwe-ayi nye n'ifè Gi, site kwa n'ijeghari n'iru Gi ri'idi-nsọ na ezi omume ubọchi nile nke ayi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Onye nsọpuru nile na otuto diri, yere Gi na Meọ Nsọ, we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

 
Ekpere nke Saint Chrysostom.

Chineke Nke puru irne ihe nile, Onye nyeworo ayi amara ubu a ka ayi were otù obi bute aririọ-ayi n'iru Gi nọbọ; Gi Onye kwere si na mbe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aha-Gi I gānu aririọ-ha; Onye-nwe-ayi, mezue ọchichọ na aririọ nke ndi-orù-Gi ubu a, otú ọ gādichasiri ha ezi nma; nye ayi ọmuma nke ezi-okwu-Gi n'uwa nka, na ndu ebighhebi n'uwa nke nābia, Amen.

2 Ndi Korint 13.

Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere ayi nile mbe nile. Amen.

Prayer of St. Chrysostom


Return home

Web author: Charles Wohlers U. S. EnglandScotlandIrelandWalesCanadaWorld