H
flag of Nigeria The Book of Common Prayer
United States England Scotland Ireland Wales Canada World

 
    Ekpere Na Abu
The Book of Common Prayer in Igbo

 

KỌLEKT NA AKWUKWỌ-OZl NA OZI ỌMA

AGANĀGU N'OGOLOGO ARỌ NILE.


Riba ama, na Kọlekt akara Sunday ọ bula, ma-ọbu nke akara Ubọchi Nsọ nke Nche ma-ọbu Anyasi diri ya, na ọ bu Kọlekt ahu lea agāgu n'Ekpere Anyasi n'ubọchi tọrọ ubọchi ahu.

Sunday mbu n' Advent.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, nye ayi amara ka ayi we yipu ọlu nile nke ọchichiri, yikwasi ihe-agha nke ìhè, ugbu a na mgbe nke ndu ọnwu nka, nke Okpara-Gi, bú Jisus Kraist, biara ileta ayi n'obi-ume-ala uku; ka ọ gābu n'ubọchi ikpe-azu, mgbe Ọ gābia ọzọ n'Ebube-Ya di otuto ikpe madu nile, ma ndi di ndu ma ndi nwuru anwu, ka ayi we bilie ba na ndu ebigh-ebi, site na Ya, bú Onye soro Gi na Mọ Nsọ di ndu, nābu kwa eze, ugbu a na mgbe nile. Amen.

Aganāgu Kọlekt nka kwa-ubọchi. ya na Kọlekt ọzọ n'Advent, rue Anyasi nke echi-ya bu Christmas.
 

The Collects, Epistles, and Gospels

to be Used Throughout the Year

 
(the Collects only are given here)

 

1st Sunday in Advent

Sunday nke-abua n'Advent.

KỌLEKT

Onye-nwe-ayi Nke di ngọzi, Onye meworo ka ede Akwukwo nsọ nile izí ayi ihe; Kwe ka ayi si otú a nānu ha, nāgu ha, nāriba ha ama, nāmuta ha, nātughari ha n'obi-ayi, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke Okwu nsọ Gi nwe olile-anya di ngọzi nke ndu ebigh-ebi, nējisi ya ike mgbe nile, bú nke I nyeworo ayi n'Onye-nzọputa-ayi Jisus Kraist. Amen.
 

2nd Sunday in Advent

Sunday nke-atọ n'Advent.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye zigara onye-ozi-Gi n'ọbibia mbu Gi ka ọ mezie uzọ-Gi n'iru Gi; Kwe ka ndi nējere Gi ozi na ndi nāchi ezi-na-ulo n'ihe-omimi-Gi we si otú a mezie dozi kwa uzọ-Gi, site n'ime ka obi ndi nānugh okwu chigharia nwe amam-ihe nke ndi ezi omume, ka ọ gābu n'obibia-Gi nke-abua ikpe uwa ikpe ka ewe hu ayi ndi amara nke-ọma n'iru Gi, Onye sora Nna na Mọ Nsọ di ndu nābu kwa eze, otú Chineke mgbe nile, rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

3rd Sunday in Advent

Sunday nke-anọ n'Advent.

KỌLEKT

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I welie ike-Gi elu, bia n'etiti ayi, were ike uku yere ayi aka; ka ọ gabu, ọ bu ezie na esitere na nmehie-ayi na ajọ omume-ayi napuru ayi nke-uku gbochi kwa ayi n'igba ọsọ ahu nke edebere n'iru ayi, ka amara na ebere nke Gi nke riri nne we yere ayi aka doputa kwa ayi ngwa ngwa; site n'ihe Ọkpara-Gi, bú Onye-nwe-ayi, mere ka afọ ju Gi, Onye nsọpuru na otuto diri, tiyere Gi na Mọ Nsọ, rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

4th Sunday in Advent

Ọmumu nke Onye-mue-ayi, ma-ọbu ubọchi amuru Kraist, nke ọrà madu nākpọ

UBỌCHI CHRISTMAS.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye nyeworo ayi Ọkpara I muru náni Ya iyikwasi n'Onwe-ya udi madu ayi bu, ka Nwa-agbọghọ nāmagh nwoke we mua Ya na mgbe dika mgbe a; Kwe ka ayi onwe-ayi, ebe amuru ayi ọzọ, me ka ayi ghọ umu-Gi site n'ido ayi ka umu na site n'amara-Gi, ka ewe nēme ayi ohu kwa-ubọchi site na Mọ Nsọ Gi; site n'otù Onye ahu, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye sora Gi na otù Mọ ahu di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke mgbe dum, rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Christmas Day

Ubọchi Saint Stifen.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, kwe ka ọ gābu n'ahuhu-ayi nile n'ebe a n'elu uwa n'ihi igba àmà nke ezi-okwu-Gi, ka ayi we nēlegide anya n'elu-igwe, we site n'okwukwe hu ebube nke agēkpughe; ọzọ kwa, ebe ayi juputara na Mọ Nsọ, ka ayi we muta ihu ndi nēsogbu ayi n'anya na igọzi ha site n'ukpuru nke Saint Stifen, bú onye-àmà-Gi eburu uzọ gbu, onye kpere Gi ekpere n'ihi ndi nēgbu ya, Jisus di ngọzi, Onye nēguzo n'aka-nri Chineke iyere ha aka, bú ndi nile nāhu ahuhu n'ihi Gi, Onye nání otù Onye-ogbugbo-ayi na Onu-nēkwuru-ayi. Amen.

Emesia, Kọlekt nke Ọmumu Jisus gēso, nke aganāgu kwa-ubọchi rue Anyaai nke echi-ya bu Ubọchi mbu n'arọ ọhu.
 

St. Stephen's Day

Ubọchi Saint Jọn, bu Onye dere Ozi Ọma n' akwukwọ.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi di ebere, ayi nāriọ Gi ka I me ka nnwupu nke ìhè-Gi nwukwasi Nzukọ-Gi, ka ọ gābu, ebe enyere ya ìhè site n'ihe-ozizí nke Saint Jọn di ngọzi, bú Onye-ozi-Gi na Onye dere Ozi Ọma n'akwukwọ, ka ọ we si otú a nējeghari n'ìhè nke ezi-okwu-Gi, ka ọ we mesia jerue n'ìhè nke ndu ebigh-ebi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. John the Evangelist

Ubọchi Umu-ntakiri nemegk ike ọja.

KỌLEKT

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye siworo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, Onye me-kwa-ra ka umu-ntakiri nye Gi otuto site n'ọnwu-ha; Me ka ajọ omume nile nwupusia n'aru-ayi, si otú a nye ayi ike site n'amara-Gi, ka ayi we were ibi-obi-ayi nke nmehie nādigh, na okwukwe-ayi nke ayi nēkwegide ọbuná rue ọnwu, nye Aha nsọ Gi otuto; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Hol;y Innocents

Sunday so ka Ubọchi Christmas gara.

KỌLEKT

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye nyeworo ayi Ọkpara I mum nání Ya iyikwasi n'Onwe-ya udi madu ayi bu, ka Nwa-agbọghọ nāmagh nwoke we mua Ya na mgbe dika mgbe a; Kwe ka ayi.onwe-ayi, ebe amuru ayi ọzọ, me ka ayi ghọ umu-Gi site n'ido ayi ka umu na site 'amara-Gi, ka ewe nēme ayi ọhu kwa-ubọchi site na Mọ Nsọ Gi; site n'otù Onye ahu, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye soro Gi na otù Mọ ahu di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke mgbe dum, rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Sunday after Christmas

Obibl-úgwù nke Kraist.

KỌLEKT.

Chin eke Nke puru ime ihe nile, Onye mere ka eble Ọkpara-Gi di ngọzi úgwù, Ọ we debere madu iwu; Biko, nye ayi ezi obibì-úgwù nke Mọ Nsọ; ka ayi onwe-ayi, ebe emeworo ka obi-ayi na ihe nile di n'aru-ayi nwupu n'ebe agu ihe uwa nile na agu aru di, ka ayi we nēme ihe nile I chọrọ, bu uche-Gi di ngọzi: site n'otu Ọkpara-Gi ahu Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Otù Kolekt na Akwukwọ-ozi na Ozi Ọma ahu ka aganāgu kwa-ubọchi, ma Ubọchi. Obibì-úgwù nke Kraist gasia, we rue Epiphany.
 

Circumcision

Epiphany, ma-ọbu Ngosi euiere Kraist gosi ndi Gentile.

KỌLEKT.

Chineke, Onye were odudu kpakpando gosi ndi Gentile Ọkpara I muru nání Ya; Were ebere kwe ka ayi onwe-ayi, bú ndi mara Gi ugbu a site n'okwukwe, ka ayi we nwezue utọ nke Chineke I bu di ebube mgbe ndu nka gasiri; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Epiphany

Sunday nke-mbu ka Epiphany gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I were ebere nara ekpere ndi nke Gi ndi nākpọku Gi; kwe ka ha hu mara kwa ihe nke kwesiri ka ha me, ka ha nwe kwa amara na ike iji mezu ha n'uzọ kwesiri ntukwasi-obi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

1st Sunday after Epiphany

Sunday nke-abua ka Epiphany gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru irne ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nāchi ihe nile, rna nke di n'elu-igwe ma nke di n'uwa; Were ebere nuru aririọ ndi nke Gi, nye kwa ayi udo-Gi ubọchi nile nke ndu-ayi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

2nd Sunday after Epiphany

Sunday nke-atọ ka Epiphany gara.

KỌLEKT

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, were ebere lekwasi adigh-ike-ayi anya, setipu aka-nri-Ga nime ize-ndu-ayi na nkpa-ayi nile iyere ayi aka na iluru ayi ọgù; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

3rd Sunday after Epiphany

Sunday nke-anọ ka Epiphany gara.

KỌLEKT.

Chineke, Onye mara na eguzoro ayi n'etiti ihe-ize-ndu di ọtutu, di kwa uku, ya bu na ayi apugh iguzozi ọtọ mgbe dum n'ihi adigh-ike nke madu ayi bu; Nye ayi otú ike na nchegide ahu nke gākwagide ayi nime ihe-ize-ndu nile, bubiga kwa ayi n'ọnwunwa nile; site na ]isus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

4th Sunday after Epiphany

Sunday nke-ise ka Epiphany gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I debe Nzukọ-Gi na ezi-na-ulo-Gi mgbe mile n'ezi uzọ-Gi: ka ewere ike uku Gi 1uara ndi dabere nání n'olile-anya nke amara nke e1u-igwe Gi ọgù mgbe nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

5th Sunday after Epiphany

Sunday nke-isi ka Epiphany gara.

KỌLEKT.

Chineke, Onye emere Ọkpara-Gi di ngọzi ka Ọ puta ìhè ka Ọ we 1a ọlu ekwensu iyi, me ayi umu Chineke, na ndi-nketa nke ndu ebigh-ebi; Kwe, ayi nāriọ Gi, ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere olile-anya nka, ka ayi we me onwe-ayi ka ayi di ọcha, dika Ya onwe-ya di ọcha: ka, mgbe O gēji puta ìhè ọzọ n'ike na ebube uku, ka ewe me ayi ka ayi yiri Ya n'ala-eze ebigh-ebi Ya di ebube; ebe O soro Gi, Nna, na Gi, Mọ Nsọ, di ndu, nābu kwa Eze, otù Chineke mgbe dum, we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

6th Sunday after Epiphany

Sunday akpọrọ Septuagesima,
ma-ọbu
Sunday nke-atọ tutu Lent erue.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I were iru-ọma nuru ekpere ndi nke Gi; ka ayi, bú ndi enyere ahuhu kwesiri ayi n'ihi nmehie-ayi, ka ewe were ebere zọputa ayi site n'obi-ọma-Gi, n'ihi otuto Aha-Gi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nzọputa-ayi, Onye soro Gi na Mọ Nsọ di ndu, nābu kwa Eze, otù Chineke mgbe dum, we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Septuagesima

Sunday akpọrọ Sexagesima,
ma-ọbu
Sunday nke-abua tutu Lent erue.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi Chineke, Onye nāhu na ayi atukwasigh obi-ayi n'ihe ọ bula ayi nēme; Were ebere kwe ka site n'ike-Gi ka ewe gbopuru ayi ihe nile nēmegide ayi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Quinquagesima

Sunday akpọrọ Quinquagesima,
ma-ọbu
Sunday nke-ikpe-azu tutu Lent erue.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, Onye ziworo ayi na ornurne-ayi nile abagh urù ọ bula ma ọ buru na ihu-n'anya adigh ha; Zite Mọ Nsọ Gi, we wua nime nkpuru-obi-ayi ezi onyinye ahu kachasi nma, bú ihu-n'anya, nke bu ezi ihe-nkekọ nke udo na nke ezi ọlu nile, nke ọ gabu ma ọ digh ya agua onye ọ bula di ndu n'onye nwuru anwu n'iru Gi: Kwere nka n'ihi nání otu Ọkpara-Gi Jisus Kraist. Amen.
 

Quinquagesima

Ubọchi nke-mbu nke Lent,
nke ọra madu nākpọ
Ash Wednesday.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nākpọgh ihe ọ bula I kèworo asi, I nāgbaghara kwa nmehie nke ndi nile cheghariri; Gi kè me kwa nime ayi obi ọhu na nke egwepiara egwepia, ka ayi, ebe ayi nākwa ákwá n'ihi nmehie-ayi nile otú ọ kwesiri, kwere kwa na ayi di imere ebere, ka ayi we nata n'aka-Gi, bú Chineke ebere nile, nhichapu na ngbaghara nmehie zuru ókè; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Aganāgu Kọlekt nka kwa-ubọchi nime Lent mgbe agusiri Kọlekt akara nye ubọchi ahu.
 

Ash Wednesday

Sunday nke-mbu nime Lent.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, Onye ji n'ihi ayi bue ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali; Nye ayi amara isi otú a ru aru-ayi uka, ka ayi, ebe ewedara anu-aru-ayi n'okpuru Mọ Nsọ, ka ayi we nuru nkwali I nākwali ayi iyi Gi n'ezi omume na ezi idi-nsọ mgbe dum, ka ewe sọpuru Gi nye Gi otuto, Onye sora Nna na Mọ Nsọ di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

1st Sunday in Lent

Sunday nke-abua nime Lent.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye nāhu na ayi enwegh ike n'onwe-ayi iyere onwe-ayi aka; Debe ayi n'ihè n'aru-ayi na n'ime na nkpuru-obi-ayi; ka ewe gbopuru ayi ihuju-anya nile nke gēme aru, na ajo èchìchè nile kwa nke gāmakwasi meru kwa nkpuru-obi aru; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Amen.
 

2nd Sunday in Lent

Sunday nke-atọ nime Lent.

KỌLEKT

Ayi nāriọ Gi, Chineke Nke puru ime ihe nile, ka I lekwasi anya n'ihe ndi-orù-Gi di ume-ala n'obi nachọ n'obi-ha, ka I setipu aka-nri nke Ebube-Gi, we buru onye nāluru ayi ọgù megide ndi-iro-ayi nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

3rd Sunday in Lent

Sunday nke-anọ nime Lent.

KỌLEKT.

Kwe, ayi nāriọ Gi, Chineke Nke puru ime ihe nile ka ayi onwe-ayi, bú ndi kwesiri ka enye ayi ahuhu n'ihi ajọ omume-ayi, ka ewere ebere gbo nkpa-ayi site na nkasi-obi nke amara-Gi; site n'Onye-nwe-ayi na Onye-nzọputa-ayi Jisus Kraist. Amen.
 

4th Sunday in Lent

Sunday nke-ise nime Lent.

KỌLEKT

Ayi nāriọ Gi, Chineke Nke puru irne ihe nile, ka I were ebere lekwasi ndi nke Gi anya; ka ewe were obi-ọma uku Gi nāchi ha nēche kwa ha mgbe ebigh-ebi, ma n'aru ma na nkpuru-obi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

5th Sunday in Lent

Sunday ikpe-azu tutu Easter erue.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye siteworo n'ezi ihu-n'anya-Gi n'ebe madu nọ zìe Okpara-Gi, bú Onye-nzọputa-ayi Jisus Kraist, iyikwasi n'Onwe-ya anu-aru-ayi, na inwu anwu n'elu obe, ka madu nile we nēso ukpuru obi-ume-ala uku Ya; Were ebere kwe, ka ayi neso kwa ukpuru nke ntachi-obi-Ya, ka ewe me kwa ayi ndi-nnwekọ nbilite-n'ọnwu-Ya: site n'otù Jisus Kraist ahu, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Sunday next before Easter (Palm Sunday)

Friday Ọma.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, ayi nāriọ Gi ka I were amara lekwasi ezi-na-ulo-Gi nka anya, nke ọ tọrọ Onye-nwe-ayi Jisus Kraist utọ ka arara Ya nye n'aka ndi ajọ madu, na inwu anwu n'elu obe, Onye soro Gi na Mọ Nsọ di ndu agbu a nābu kwa Eze, otù Chineke mgbe dum, uwa ebigh-ebi. Amen.
    Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye Mọ-Gi nāchikọ aru nile nke Nzukọ Kraist, nēdo kwa ya nsọ; Nara aririọ-ayi na ekpere-ayi, nke ayi nēkpere Gi n'ihi ọnọdu nile nke madu nọ na Nzukọ nsọ Gi, ka onye ọ bula nime ya, n'ọkpukpọ nke ya na ije-ozi-ya, we were ezi-okwu na iyi-Chineke nējere Gi ozi; site n'Onye-nwe-ayi na Onye-nzọputa-ayi Jisus Kraist. Amen.
    Chineke Ebere, Onye kèworo madu nile, ọ digh kwa ihe ọ bula I kèworo I kpọrọ asì, I chọgh kwa ọnwu onye-nmehie, kama ka ọ chigharia di kwa ndu; Mere ndi-Ju nile ebere, ha na ndi Mohamed nile, na ndi nile nekwegh n'Ọkpara-Gi, na ndi nile hiere uzọ n'ihe-ozizl-Gi, wepu nime ha amagh-ihe nile, na obi ike, na ileda Okwu-Gi anya; si otú a kpọla ha ulo lakuru ìgwè-aturu-Gi, Onye-nwe-ayi di ngọzi, ka ewe zoputa ha n'etiti ndi ezi Israel fọduru, ka ewe me kwa ha otù ìgwè aturu n'okpuru otù Onye nāzù ha, bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi, Onye sora Gi na Mọ Nsọ di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Good Friday

Anyasi nke echi-ya bu Easter.

KỌLEKT

Onye-nwe-ayi, kwe ka, otú emere ayi baptism ibà n'ọnwu Ọkpara-Gi di ngọzi, bú Onye-nzọputa-ayi Jisus Kraist, ka ewe si otú a likọ ayi na Ya site n'ime ka ọchichọ-aru-ayi nke nēre ure nwua mgbe nile; ka ayi we si kwa n'ílì na ọnu-uzọ ọnwu gabiga na nbilite-n'ọnwu-ayi di ọṅu; n'ihi ọlu ọma Ya, bú Onye ahu nwuru anwu, elì-kwa-ra Ya, O bili kwa ọzọ n'ihi ayi, bu Ọkpara-Gi Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Easter Even

Ubọchi Easter.

N'Ekpere Ututu, n'ọnọdu Abù Ọma, Bianu, ka ayi tikue Jehova, etc., agābù ma-ọbu gua Anthem ndia.

Achuru àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist: ya mere, ka ayi nēme ememe ahu;
    Ọ bugh n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bugh kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ olu: kama n'achicha ekogh-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.    1 Ndi Kọrint 5. 7, 8.

Ebe emere ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie Ọ gagh-anwu ọzọ: ọnwu abugh kwa onye nēnwe Ya ọzọ.
    N'ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n'ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n'ebe Chineke nọ.
    Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di: ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ.    Ndi Rom 6. 9, 10, 11.

Emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie: nkpuru mbu nke ndi daworo n'ura ọnwu.
    N'ihi na ebe ọnwu sitere n'aka madu : nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu site-kwa-ra n'aka madu.
    N'ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam: ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.    1 Ndi Kọrint 15. 20, 21, 22.

    Otutọ diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;
    Otú ọ diri na mbu, ọ di ugbu a, ọ gādigide otú a: we rue n'uwa ebigh-ebi. Amen.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime nile, Onye siteworo n'Ọkpara-Gi Jisus Kraist I mum nání Ya we merie onwu, meghe-kwa-ra ayi ọnu-uzọ ndu ebigh-ebi; Ayi ji obi di ume-ala ariọ Gi, ka, otú I nētiye n'uche-ayi ezi ọchichọ site n'àmàrà-Gi amara aha-ya nēburu ayi uzọ, ka ayi we si otú a weputa otù ihe ahu ezi ihe site n'iye-aka-Gi mgbe dum; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Onye soro Gi na Mọ Nsọ di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke mgbe nile, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Easter Day

Sunday nke-mbu ka Easter gara.

KỌLEKT.

Nna Nke puru ime ihe nile, Onye wereworo nání otù Ọkpara I nwere nye inwu ọnwu n'ihi nmehie-ayi, na ibili ọzọ n'ihi igu ayi na ndi ezi omume; Kwe ka ayi si otú a wepu ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, ka ayi we nējere Gi ozi mgbe dum n'idi ndu di ọcha na ezi-okwu; site n'ọlu ọma nke otù Onye ahu, bú Ọkpara-Gi Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Amen.
 

1st Sunday after Easter

Sunday nke-abua ka Easter gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye wereworo nání otù Ọkpara I nwere nye ka Ọ ghọrọ ayi àjà n'ihi nmehie na ihe ilere anya nke ndu di dika Chineke; Nye ayi amara ka ayi were ekele uku mgbe dum nānara urù-Ya ahu anāpugh imata udi-ya, ka ayi jisi kwa ike kwa-ubọchi iso ije-ukwu di ngọzi nke ndu-Ya kasi di nsọ; site n'otù Jisus Kraist ahu, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

2nd Sunday after Easter

Sunday nke-atọ ka Easter gara.

KỌLEKT.

Chin eke Nke puru ime ihe nile, Onye nēgosi ndi hiere uzọ ìhè nke ezi-okwu-Gi, ka ha we laghachi n'uzọ ezi omume; Kwe ndi nile akpọbatara nime nnwekọ nke Uzọ nke Kraist, ha ka we ju ihe nile megidere ihe ha kwuputara na ha bu, we nēso ihe nile ahu dabayere n'otù ihe ahu; site n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. Amen.
 

3rd Sunday after Easter

Sunday nke-anọ ka Easter gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye náni Gi purn idozi ọchichọ na uche nàdigh nchikọta nke ndi-nmehie; Kwe ndi nke Gi, ka ha hu ihe nke I nyere n'iwu n'anya, ka agu ihe nke I kwere nkwa nāgu kwa ha; ka ọ gābu, n'etiti ọtutu ntughari di iche iche nke uwa, ka obi-ayi we si otú ahu gbagide n'ebe ahu ezie, ebe agāhu ezi ọṅu: site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

4th Sunday after Easter

Sunday nke-ise ka Easter gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, Onye ezi ihe nile nēsite n'aka-Gi: Kwe ayi, bú ndi-orù-Gi di ume-ala n'obi, ka ayi site n'iku-ume nsọ Gi we nēchè ihe di nma, ka ayi site kwa n'odudu nke ebere-Gi we me otù ihe ahu; site n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. Amen.
 

5th Sunday after Easter

Ubọchi Nrigo-n'elu-igwe.

KỌLEKT.

Kwe, ayi nāriọ Gi, Chineke Nke puru ime ihe nile, ka ayi onwe-ayi, otú ayi kwere na Ọkpara I muru nání Ya, bú Jisus Kraist, na Ọ rigowo n'elu-igwe: ka ayi onwe-ayi we si kwa otú ahu rigo n'ebe ahu n'obi-ayi na uche-ayi, we soro Ya biri mgbe dum, Onye soro Gi na Mọ Nsọ di ndu nabu kwa Eze, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Ascension

Sunday so ka Ubọchi Nrigo-n'elu-igwe gara.

KỌLEKT.

Chineke, Eze nke otutu, Onye buliworo nání Ọkpara I nwere, nú Jisus Kraist, na nmeri uku we rue n'ala-eze-Gi n'elu-igwe; Ayi nāriọ Gi, arapula ayi ka umu-ngbei; ma zitere ayi Mọ Nsọ Gi ikasi ayi obi, buli kwa ayi n'otù ebe ahu ebe Onye-nzọputa-ayi Kraist bu uzọ jebe, Onye sora Gi na Mọ Nsọ di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Sunday after Ascension

Whit-Sunday.

KỌLEKT.

Chineke, Onye ziri obi ndi nke Gi kwere ekwe ihe, site n'izitere ha ìhè nke Mọ Nsọ Gi; Kwe ka ayi si n'otù Mọ ahu nwe ikpe ziri ezi n'ihe nile, ka ayi ṅuri kwa ọṅu mgbe nile nime nkasi-obi-Ya di nsọ; site n'ọlu ọma Kraist Jisus, bú Onye-nzọputa-ayi, Onye sora Gi di ndu nābu kwa Eze, n'idi-n'otù nke otù Mọ ahu, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

 

Sunday nke Trinity.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nyeworo ayi, bú ndi nējere Gi ozi, àmàrà site na nkwuputa nke ezi okwukwe ikwere n'otuto nke Trinity di ebigh-ebi, na n'ike nke Ebube uku nke Chineke ikpere Idi-n'otù ahu; Ayi nāriọ Gi, ka I guzosie ayi ike n'okwukwe nka, nēgbopuru ayi ihe-ihuju-anya nile mgbe dum, Onye di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

Trinity Sunday

Sunday nke-mbu ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, bú ike nke ndi nile tukwasiri obi-ha na Gi, biko were ebere nara ekpere-ayi; kwe kwa, ka ayi onwe-ayi, n'ihi na site n'adigh-ike aru-ayi nānwu anwu ayi apugh ime ezi ihe ọ bula ma I nọgh ya, ka ayi nwe iye-aka nke amara-Gi, we site n'idebe ihe I nyere n'iwu me ihe n଩tọ Gi utọ, ma n'ọchichọ ma n'omume; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

1st Sunday after Trinity

Sunday nke-abua ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, Onye nādigh-ewepu aka iyere ha aka na ichi ha, bu ndi I nāzulita n'egwù-Gi na ihu-n'anya-Gi nāguzosi ike; Debe ayi, ayi nāriọ Gi, n'okpuru nchebe nke ezi iburu-uzọ-hu-ihe nke I nāhu, me kwa ka ayi nwe egwù na ihu-n'anya nke Aha-Gi di nsọ mgbe nile; site na ]isus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

2nd Sunday after Trinity

Sunday nhe-atọ ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I were ebere nuru olu-ayi; kwa kwa ka ayi onwe-ayi, bú ndi I nyeworo obi ọ nāgu agu ikpe ekpere, ka ewe site n'iye-aka-Gi di uku luara ayi ọgù kasi kwa ayi obi n'ihe-ize-ndu na ihe-ihuju-anya nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

3rd Sunday after Trinity

Sunday nke-ano ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, Gi Onye-nchebe nke ndi nile tukwasiri obi na Gi, Onye ọ gābu ma I nọgh ya ọ digh ihe ọ bula di ike, ọ digh kwa ihe ọ bula di nsọ; Me ka ebere-Gi ba uba ri kwa nne n'aru ayi: ka ayi, ebe Gi onwe-gi bu Onye nāchi ayi na Onye nēdu ayi, ka ayi we si otú a gabiga ihe nādi nwa mgbe, ka ihe nke nādiru mgbe ebigh-ebi we mesia ghara ifunari ayi; Kwe nka, Nna nke elu-igwe, n'ihi Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

4th Sunday after Trinity

Sunday nke-ise ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Kwe, Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi, ka esi n'uzọ udo dozie ihe nile nke uwa nka site na nchikọ nke Gi otú a, ka Nzukọ-Gi we were ọṅu nāfè Gi òfùfè n'idi-nwayọ nile nke kwesiri ndi Chineke; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

5th Sunday after Trinity

Sunday nke-isi ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, Onye doziworo nye ndi hum Gi n'anya otú ezi ihe nke kariri uche madu; Wusi n'obi-ayi otú ihu-n'anya n'ebe Gi onwe-gi nọ, ka ọ gābu, ebe ayi huru Gi n'anya karia ihe nile, na ayi gānata nkwa-Gi nile, nke kachasi ihe nile ayi puru ichọ; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Amen.
 

6th Sunday after Trinity

Sunday nke-asa ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, Gi Onye nwe ike na ume nile, Onye nēkè nēnye kwa ezi ihe nile; Nyakudo n'obi-ayi ihu-n'anya nke Aha-Gi, me ka ezi okpukpe-Chineke ba uba nime ayi, were idi-nma nile zùa ayi, site n'ebere uku Gi debe ayi n'otù ihe ahu; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

7th Sunday after Trinity

Sunday nke-asatọ ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, Onye iburu-uzọ-hu-ihe nke I nāhu nādigh-agwu agwu nēdozi ihe nile, ma nke di n'elu-igwe ma nke di n'uwa; Ayi ji obi di ume-ala ariọ Gi ka I wepuru ayi ihe nile nālu aru, ka I nye kwa ayi ihe nile nke gābara ayi uru; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

8th Sunday after Trinity

Sunday nke-iteghete ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi, ka I nye ayi mọ nke ichè na irne ihe ziri ezi mgbe nile; ka ayi, bú ndi nāpugh ime ihe ọ bula di nma ma I nọgh ya, ak ayi we site na Gi nwe ike idi ndu dika I si achọ; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

9th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, kwe ka nti-Gi di ebere ghe oghe n'ekpere nile nke ndi-orù-Gi di ume-ala n'obi; Gi me kwa ka ha riọ ihe gātọ Gi utọ, ka ha we riọta ihe ha nāriọ n'aka-Gi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Amen.
 

10th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-otù ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, Onye kọkariri akukọ ike-Gi nke puru ime ihe nile n'ime ebere na in we ọmiko; Were ebere nye ayi otú ọtùtù nke amara-Gi, ka ayi we nāgbaso iwu-Gi nile, we nata nkwa nke amara-Gi, erne kwa ayi ndi-nketa nke àkù elu-igwe nke Gi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

11th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-abua ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nējikere mgbe nile inu olu-ayi karia ka ayi nējikere ikpe ekpere, Onye nēnye kwa ihe karia ka ayi chọrọ ma-ọbu ka ayi kwesiri inwe; Wukwasi ayi ebere-Gi bara uba; gbaghara ayi ihe nile akọ-na-uche-ayi nātu egwu, nye kwa ayi ezi ihe nile nke ayi nēkwesigh iriọ, ma-ọbugh site n'ọlu ọma na ogbugbo nke Jisus Kraist, bú Ọkpara-Gi, Onye-nwe-ayi. Amen.
 

12th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-atọ ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru irne ihe nile, Nke bu kwa Onye ebere, Onye ọ bu nání site n'onyinye-Gi ka ndi kwere na Gi nēfè Gi ezi òfùfè nke di otuto; Kwe, ayi nāriọ Gi, ka ayi si otú a nēfè Gi òfùfè n'uzọ kwesiri ntukwasi-obi na ndu nka, ka ayi mesia ghara itufu nkwa-Gi nke elu-igwe; site n'ọlu oma nke Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Amen.
 

13th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-anọ ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, nye ayi uba nke okwukwe na olile-anya na ihu-n'anya; me kwa ka ayi hu ihe I nyere n'iwu n'anya, ka ayi we nata ihe nke I kwere nkwa; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

14th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-ise ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I were ebere-Gi di ebigh-ebi debe Nzukọ-Gi: ọzọ kwa, n'ihi na adigh-ike madu aghagh ida ada ma I nọgh ya, debe ayi mgbe nile site n'iye-aka-Gi ka ayi ghara idaba n'ihe ọ bula nālu aru, ka I durn kwa ayi ba n'ihe nile bara urù na nzọputa-ayi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

15th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-isi ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi, ka ebere-Gi nke nādi mgbe nile sacha Nzukọ-Gi, lu-kwa-ra ya ọgù: Gi were kwa iye-aka-Gi na obi-ọma-Gi chebe ya rngbe ebigh-ebi, n'ihi na ọ pugh inọgide n'udo ma iye-aka-Gi adigh ya; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

16th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-asa ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nēkpere Gi ka àmàrà-Gi buru uzọ ga n'iru ayi nēso kwa ayi n'azu mgbe nile, ka ọ me kwa ka ọ eli ayi n'obi mgbe elum ilu ezi ọlu nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

17th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-asatọ ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I nye neli nke Gi amara iji guzogiele ọnwunwa nile nke uwa na anu-aru na ekwensu, na iji were obi na uche eli ọcha nēso Gi Onye nani Gi bu Chineke; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

18th Sunday after Trinity

Sunday nke-iri-na-iteghete ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, ebe ayi nāpugh ime ihe gātọ Gi utọ ma I nọgh ya; Were ebere kwe ka Mọ Nsọ Gi nēdu nāchi kwa obi-ayi n'ihe nile; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

19th Sunday after Trinity

Sunday nke-orú ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru irne ihe nile na Nke kasi ebere, ayi nāriọ Gi ka I were oké obi-ọma-Gi debe ayi, ka ayi ghara idabà n'aka ihe ọ bula nke nwere ike ilu ayi aru; ka ayi we nọ na nijikere ma n'aru ma na nkpuru-obi, were obi utọ mezue ihe nile I chọrọ ka ayi me; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

20th Sunday after Trinity

Sunday nke-orú-na-otù ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Ayi nāriọ Gi, Onye-nwe-ayi di ebere, ka I nye ndi kwere na Gi ngbaghara-nmehie na udo, ka ewe sachapu nmehie nile ha, ha ewere kwa uche di nwayọ nējere Gi ozi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Amen.
 

21st Sunday after Trinity

Sunday nke-orú-na-abua ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi ka I debe ezi-na-ulo-Gi, bú Nzukọ-Gi, n'iyi-Chineke mgbe nile; ka ọ we site na nchebe-Gi ghara idabà n'aka ihe ọ bula nēmegide ya, ka ọ were kwa egwù Chineke rara onwe-ya nye n'ijere Gi ozi n'ezi ọlu nile, ka otuto we diri Aha-Gi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

22nd Sunday after Trinity

Sunday nke-oru-na-ato ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Chineke, bú ebe-ngbaba-ayi na ike-ayi, Onye kèworo ihe nile yiri Gi; Ayi nāriọ Gi, ka I jikere inu ekpere nile Nzukọ-Gi nēkpe n'egwù-Gi; kwe kwa ka ayi riọtazue ihe nile ayi nāriọ n'okwukwe ; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

23rd Sunday after Trinity

Sunday nke-orú-na-anọ ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi, ayi nāriọ Gi, ka I tọpu ndi nke Gi n'ihe ọjọ nile ha mere; ka ewe site n'oké obi-ọma-Gi dọputa ayi nile n'agbu nmehie nile nke ayi meworo site n'adigh-ike-ayi. Kwere nka, Nna nke elu-igwe, n'ihi Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi na Onye-nzọputa-ayi. Amen.
 

24th Sunday after Trinity

Sunday nke-oru-na-ise ka Trinity gara.

KỌLEKT.

Ayi nāriọ Gi, Onye-nwe-ayi, ka I kpalie ọchichọ nke ndi-Gi kwere ekwe; ka ha we mia ọtutu nkpuru, bú ezi ọlu, ka I we nye ha ọtutu ihe n'ile-ọlu: site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

Ọ buru na Sunday ọzọ fọduru tutu Sunday nke Advent erue, Kọlekt na Akwukwọ-ozi na Ozi Ọma nke Sunday ufọdu. arapuru ka Epiphany gara ka agāga na Sunday ahu ka ha ra, bú nke fọduru n'ebe a. Ọ buru kwa na Sunday di ka Trinity qara erugh orú na ise agārapu ndi fọduru: ma otú ọ di, aghagh igu Kọlekt na Akwukwọ-ozi na Ozi Ọma nke-ikpe-azu a mgbe nile na Sunday nke-ikpe-azu tutu Advent erue.
 

25th Sunday after Trinity

Ubọchi Saint Andru.

KỌLEKT.

Chineke Nke pum ime ihe nile, Onye nyere Onye-ozi-Gi di nsọ, bú Saint Andru, amara di otú a, na ọ mere ngwa kwere òkù nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist kpọrọ ya, ọ we so Ya nālagh azu; Kwe ka ayi nile, ebe akpọrọ ayi site n'Okwu-Gi di nsọ, ka ayi were onwe-ayi nye n'imezu iwu nsọ Gi nile ngwa ngwa n'inu-okwu ; site n'otù Jisus Kraist ahu, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Andrew

Saint Tomas, bú Onye-ozi.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye ji n'ihi ka okwukwe we guzosie ike kari we kwe ka Onye-ozi-Gi di nsọ, bú Tomas, nwe obi abua na nibilite-n'ọnwu nke Ọkpara-Gi; Kwe ka ayi gēsi kweka Ọkpara-Gi Jisus Kraist nke-ọma, ghara inwe obi abua ọ bula, ka aghara ibara okwukwe-ayi nba mgbe ọ bula n'iru Gi. Nuru olu-ayi, Onye-nwe-ayi, site n'otù Jisus Kraist ahu, Onye nsọpuru nile na otuto diri, tiyere Gi na Mọ Nsọ, ugbu a na mgbe nile. Amen.
 

St. Thomas

Nchighari nke Saint Pọl.

KỌLEKT.

Chineke, Onye siteworo na nkwusa nke Onye-ozi ahu di ngọzi, bú Saint Pọl, we me ka ìhè nke Ozi Ọma nwusa n'uwa: Kwe, ayi nāriọ Gi, ka, ehe ayi nēcheta nchighari-ya di ebube, ka ayi we gosi ekele ayi ji n'ebe I nọ n'ihi otù ihe ahu, site n'iso ihe-ozizí di nsọ nke o ziri; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

Conversion ofr St. Paul

Ọchiche echere Kraist n'iru Chineke n'ulo uku Chineke, nke ọra madu nākpọ
Ọmume emere ka Saint Meri di ọcha, bú, Nwa-agbọghọ nāmagh nwoke.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, ayi ji obi di ume-ala ariọ Ebube uku Gi, ka, otú esi were Ọkpara I muru nání Ya che n'iru Gi nime ulo uku Chin eke n'ubọchi ta n'udi nke anu-aru-ayi, ka esi otú ahu were ayi che n'iru Gi n'obi di ọcha na nke nwuru enwu, site n'aka otù Ọkpara-Gi ahu Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

The Purification of St. Mary the Virgin

Ubọchi Saint Mataias.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye rọputara orù-Gi kwesiri ntukwasi-obi, bú Mataias, ka ọ nọchie ọnọdu onye rara Jisus nye n'aka ndi-iro-Ya, bú Judas, ọ we di n'ọnu-ọgugu nke Ndi-ozi iri na abua ahu; Kwe ka anēchebe Nzukọ-Gi mgbe dum ka Ndi-ozi ugha ghara idi ya, ka ewe nāchi ya nēdu kwa ya site n'aka ndi-ọzùzù kwesiri ntukwasi-obi, ndi nāzù ya dika aturu n'ezi-okwu; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Matthias

Ọgwugwa-okwu agwara Meri, bú Nwa-agbọghọ di ngọzi nāmagh nwoke.

KỌLEKT.

Ayi nāriọ Gi, Onye-nwe-ayi, ka I wusi amara-Gi nime obi-ayi; ka, otú ayi maworo na emere Ọkpara-Gi Jisus Kraist ka Ọ ghọ madu site n'ozi nke mọ-ozi, ka ewere kwa obe-Ya na ihu-ahuhu-Ya weta ayi n'otuto nke nbilite-n'ọnwu-Ya: site n'otù Jisus Kraist ahu, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

The Annunciation

Ubọchi Saint Mak.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru irne ihe nile, Onye wereworo ihe-ozizi elu-igwe nke onye ahu dere Ozi Ọma Gi n'akwukwọ, bú Saint Mak, we zí Nzukọ-Gi di nsọ ihe; Nye ayi amara, ka ayi we ghara idi ka umu ọhu ndi ifufe nile ọ bula nke ozizi nābagh nihe nēbughari, ka ewe me ka ayi guzosie ike n'ezi-okwu nke Ozi Ọma Gi di nsọ; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Mark

Ubọchi Saint Filip na Saint Jemes.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye imara Gi ezie bu ndu ebigh-ebi; Kwe ka ayi rnazue na Ọkpara-Gi Jisus Kraist bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu; ka ayi we nēso ije-ukwu nke Ndi-ozi-Gi di nsọ, bú Saint Filip na Saint Jemes, we jisie ike nāga n'uzọ ahu nke nēdubà na ndu ebigh-ebi; site n'otù Onye ahu, bú Ọkpara-Gi Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Philip & St. James

Saint Banabas, bú Onye-ozi.

KỌLEKT.

Onye-nwe-ayi Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye were onyinye nke Mọ Nsọ etuputara etuputa yikwasi Onye-ozi-Gi di nsọ, bú Banabas, dika uwe; Ayi nāriọ Gi, ekwela ka ayi gbara aka ọtutu onyinye-Gi di iche iche, ma-ọbu anara iji ha nēme ihe mgbe dum inye Gi nsọpuru na otuto; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Barnabas

Ubọchi Saint Jọn Baptist.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye sitere n'iburu-uzọ-hu-ihe I nahu we me ka amua onye nējere Gi ozi, bú ]ọn Baptist, n'uzọ di ebube, zite kwa ya idozi uzọ Okpara-Gi Onye-nzoputa-ayi, site n'ikwusa nche-ghari; Biko, me ka ayi si otú a sobe ihe-ozizi-ya na ndu-ya di nsọ, ka ayi we chegharia ezie otú nkwusa-ya di; ka ayi we so kwa ije-ukwu-ya, ma-ọbu n'ikwu ezi-okwu mgbe dum, ma-ọbu n'iwere anya-ike bara ihe ọjọ nba, ma-ọbu n'iwere ntachi-obi hu ahuhu n'ihi ezi-okwu; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. John the Baptist

Ubọchi Saint Pita.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye sitere n'aka Ọkpara-Gi Jisus Kraist we nye Onye-ozi-Gi Saint Pita ọtutu onyinye ọma, nye kwa ya iwu ijisi ike nāzù ìgwè-aturu-Gi: Ayi nāriọ Gi, ka I me ka Ndi-bishop nile na Ndi-ọzùzù-aturu-Gi di ọku n'ikwusa Okwu-Gi di nsọ, ka I me kwa ka ọra madu were obi inu-okwu nēso Okwu ahu, ka ha we nara okpu-eze nke bu otuto ebigh-ebi; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Peter

Saint Jemes, bú Onye-ozi.

KỌLEKT.

Chineke nke di ebere, kwe ka, otú Onye-ozi-Gi di nsọ, bú Saint Jemes, rapuru nna-ya na ihe nile ọ nwere, we ghara ila azu n'ikwere òkù nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist kpọrọ ya, ọ we soro Ya; ka ayi onwe-ayi si otú a ju agu nile nke ihe uwa na nke anu-aru, we jikere mgbe nile iso ihe nsọ nile I tiri n'iwu; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. James the Apostle

Saint Batọlọmiu, bú Onye-ozi,

KỌLEKT.

Chineke Nke pum ime ihe nile, Nke di ndu ebigh-ebi, Onye nyere Onye-ozi-Gi Batọlọmiu amara ikwere ezie na ikwusa Okwu-Gi; Ayi nāriọ Gi, ka I kwe ka Nzuko-Gi hu Okwu ahu nke ọ kwere n'anya, ka o kwusa kwa otú Okwu ahu, nara kwa ya; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Bartholomew

Saint Matiu, bú Onye-ozi.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye sitere n'Ọkpara-Gi di ngọzi we si nulo-ùtú kpọ Matiu ibu Onye-ozi na Onye dere Ozi Ọma n'akwukwọ; Biko, nye ayi amara iji rapu ọchichọ nile nke anya-uku, na iji ghara ihubiga àkù n'anya ókè, na iji so otù Onye ahu, bú Ọkpara-Gi Jisus Kraist, Onye sora Gi na Mọ Nsọ di ndu nābu kwa Eze, otù Chineke, uwa ebigh-ebi. Amen.
 

St. Matthew

Saint Maikael na Mọ-ozi nile.

KỌLEKT.

Chineke Nke di ndu ebigh-ebi, Onye kaworo do kwa ije-ozi nke Mọ-ozi na madu n'usoro di ebube; Were ebere kwe ka, otú Mọ-ozi-Gi di nsọ nējere Gi ozi mgbe nile n'elu-igwe, ka ha si otú a we nēyere ayi aka nālu-kwa-ra ayi 9gu n'elu uwa nka site n'iwu nke Gi; site n'ọlu ọma nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Michael & all Angels

Saint Luk, bú Onye dere Ozi Ọma n'akwukwọ.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye kpọrọ Luk, bú Dibia, onye otuto-ya di n'Ozi Ọma, ka ọ buru Onye dere Ozi Ọma n'akwukwọ, ka ọ buru kwa Dibia nke nkpuru-obi madu; Biko, ka ọ tọ Gi utọ, ka ewe gwọ ọria nile nke nkpuru-obi-ayi site n'ezi ọgwu nke ihe-ozizí o ziri; site n'ọlu ọma nke Ọkpara-Gi Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi, Amen.
 

St. Luke

Saint Saimon na Saint Jud, bú Ndi-ozi.

KỌLEKT.

Chin eke Nke puru ime ihe nile, Onye wuworo Nzukọ-Gi n'elu ntọ-ala nke bu Ndi-ozi na Ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus Onwe-Ya; Kwe ka ayi si otú abu nyagide n'idi-n'otù nke mọ site n'ihe-ozizí-ha, ka ewe me ayi ulo nsọ nke ihe-ya nātọ Gi utọ; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.
 

St. Simon & St. Jude

Ubọchi Ndi nsp nile.

KỌLEKT.

Chineke Nke puru ime ihe nile, Onye nyagidere ndi I rọputara n'otù nnwekọ na otù nketa, nime aru di omimi nke Ọkpara-Gi Kraist, bú Onye-nwe-ayi; Biko, nye ayi amara isi otú a nēso Ndi nsọ Gi di ngọzi n'idi ndu ọma nile na nke yiri Chineke, ka ayi we bia n'ọṅu ahu nke anāpugh ikọ akukọ-ha, nke I doziworo ndi nējigh aghughọ hu Gi n'anya; site na Jisus Kraist, bú Onye-nwe-ayi. Amen.

All Saints


Return home

Web author: Charles Wohlers U. S. EnglandScotlandIrelandWalesCanadaWorld